I gbochi ihe mberede okporo ụzọ

0
864

Uchenwa Mba

 

IHE mberede nke okporo ụzọ bụ ihe onye ọbụna n’arịọ Chukwu ka ọ ghara ị dakwasi ya. Oge ụfọdụ, ilebaa anya na ihe mberede na-eme, ị hụ na ọ bụ akpachapụghị anya nke mmadụ kpatara ya. Nke a pụtara na ọ bụ n’aka mmadụ ka ọnwụ na esite.

Ụfọdụ ihe ma ọ bụ ụzọ ihe mberebe si adapụtakarị bụ enweghị ndidi, ejighi nwayo anya ugboala, adighị ele anya otu ụzọ si dị na kwa a maghị ebe ụzọ gbara ngọ.

Oge ụfọdụ, onye chọọ ị gafe ụgbọala dị ya n’iru, ọ gaghị ele anya nke ọma. Ọtụtụ ndị na-anya ụgbọala a naghị eche maka ndị ọzọ, chee na ọ bụ nanị ha nwe ụzọ. Ịńụ oke mmanya wee na anya ugboala ma ọ bụ ise anwụrụ ike sokwa eweta ihe mberede okporo ụzọ.

Nke ọzọ jọgburu onwe ya bụ ịnya ụgbọala adịchaghị mma, tinyere ụzọ ala anyị nile jogburu onwe ha.
Ụzọ a ga-esi gbochie ọtụtụ ihe mberede okporo ụzọ n’ala anyị bụ ịkpachapụ anya nke ọma maka na ilu Igbo sịrị na oji nwayọ adịghị emeru arụ. Iji nwayo na tutu mmadụ ọbụla eburu ụgbọala pụọ n’okporo ụzọ, ọ hụ na ugboala ahụ dị mma.Onye na-anya, ọ na-ele anya nke ọma. Site n’ụzọ dị otu a, a ga-enwe mgbochi nye ọtụtụ ihe mberede na nnapụ ụmụ afọ ala anyị ndụ ha n’ike n’okporo ụzọ dị iche iche nke ala anyị.

Ewepu ihe mberede nke akpachapụghị anya na-ebute na nke erubeghị isi nye ụkpụrụ na usoro nke okporo ụzọ, kedu maka ụzọ ọjọọ jụpụtara ala anyị nile? Mgbe ụfọdụ,gọọmenti nye ndị na-alụ ụzọ ọlụ ka ha lụọ, ha alụọ ha otu o siri masị ha, were ego e kwesiri iji weta ezi akụrụ ngwa tinye n’akpa ha, nwa oge, ụzọ ahụ emebie.

GUO:  Ihe mberede okporo ụzọ egbuola otu onye n'Nkpor, merụọ ọtụtụ ahụ

Ọ dị mgbe m gara Mgbo, n’Ebonyi Steeti, ndị ọlụ ngo na-alụ ụzọ ebe ahụ n’alụ ya na udi ọ ga-eru ọtụtụ afọ tutu o mebie. Ha na-awụ ụzọ ahụ ka e si awụ akwa mmiri. Onye isi na-ahụ maka ọlụ okporo ụzọ na enyochakwa ọlụ ahụ ịhụ na ndị ọlụ ngo ahụ na-alụ ya otu o kwesiri.

N’ajụjụ nke onye ọlụ anyị jụrụ otu nwamadị na-anya ugboala nke na-agba n’obi gọọmenti a kpọrọ ‘Perm site’- Eke Awka, aha ya bụ Charles Mbanefo, nwamadi a bụ onye lụrụ ọlụ n’ụlọ ọlụ NYSC ma laa ezumike nka sịrị na ha na-agba Perm Site ruo Abagana mgbe ụfọdụ mana ọ dịkwa ndị na adịghị eru Abagana. Ọ sịrị na ya malitere ịnya ụgbọala n’afọ 1978.

Ọ gara n’iru kwuo na ọ bụ ụgbọala ka ya nyara na ụlọ ọlụ ya ma mee nke ọma n’oge ya ma lụọ ọlụ oyibo,natakwa ọtụtụ nkwanye ugwu maka ịnya ụgbọala nwayọ, ịkpachapụ anya na irube isi nye iwu okporo ụzọ.

O kwuru n’ihe na-ebute ihe mberede nke okporo ụzọ bụ akpachapụghị anya, enweghị ndidi, ịńụ oke mmanya mgbe mmadụ ka na alụ ọlụ ya, ise anwụrụ ike, nakwa erubeghi isi nye iwu okporo ụzọ.

“Ajọ okporo ụzọ dị ebe nile n’ala anyị, tinyere ịgba nnukwu ọsọ na ihe ndị ọzọ ohere agaghị ekwe ka anyị kwu ebe a, tinyere n’ụfọdụ ndị na-anya ụgbọala a mụghị ịnya ụgbọala na-ebute ihe mberede okporo ụzọ”

Mazị Mbanefo sịrị na ọtụtụ afọ ya nyagoro ugboala, na ya enwebeghị ihe mberede okporo ụzọ nke mere o jiri nata ọtụtụ ugwu n’ọlụ oyibo.

GUO:  Ndị Umuchu akpọkuola gọọmentị maka ihe mberede na-eme n'okporo ụzọ Afo-Ibughubu

Ndị ọlụ ‘Federal Road Safety Corps (FRSC)’ bụ ndị na-ahụ maka ụgbọala na-agba n’okporo ụzọ ala anyi kwesiri na-egbughi oge, iwepụta anya nkịta ji eri nsị n’ebe ndị na-anya ụgbọala n’ala anyi nile nọ ka e wee nwee ezi nchekwa ndụ na akụ na ụba n’ala anyi nile gbaa gburugburu.

Otụ e si enwe ihe mberede nke okporo ụzọ n’ala anyị mere ka agụọ ala Nigeria na ndị kachasi enwe ihe mberede nke Okporo ụzọ n’ụwa nile. Ewepụ mkpamkpa ndi Boko Haram na-akpa n’ala anyi, ihe mberede bụ nọọ ụzọ ọzọ ọnwu ji anapụ ndi ala anyi ndụ n’ike.

Ndi otu ‘World Health Organisation (WHO)’ kwuru n’ala Nigeria bụ obodo kachasi anwụ ọnwụ ihe mberede okporo ụzọ na mba Africa n’agbanyeghị ihe nkụzi ndị (FRSC) na ndị otu dị iche iche na-enye gbasara ịnya ụgbọala.

Okwesịrị ka ndị na-ahụ maka okporo ụzọ malite idozi ebe ọ bụla ụzọ mebiri emebi ka ewee nwee nchekwa ndụ n’okporo ụzọ anyị nile. Okwesiri ka onye ọbụla na-anya ụgbọala nwee mmụọ nke nchekwa ndụ, ka ha kwụsị ịnya dịka ha ga-eji otu nkeji rue ebe dị anya. Onye na-anya ụgbọala,ya bụrụ onye nche nwanne ya.

Ihe ọzọ bụ na e kwesịrị idebe ihe eji ama na ụzọ adịghị mma, ma ọ bụ n’ụzọ abụọ jikọrọ ọnụ n’iru ,ma ọ bụ n’ụzọ gbagọrọ agbagọ ma ọ bụ mebie emebie ka e wee zọpụta ndị ala anyị n’ọnwụ nke okporo ụzọ. Nke ọzọ bụ na ndị na-alụ ụzọ kwesiri mgbe ha nọ n’ọlụ, ha edebe ihe ndị na-anya ụgbọala ga-eji mara n’ụzọ nwere ka ọ dị n’iru.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here