N’ Anambra, aka akparala ndị ohi iri n’ọdọ ụgbọala

0
534
ọchụ

Chinwendu Uzoatu dere akụkọ ndị

 

NDỊ uweojii na steeti Anambra anwụchịkọọla mmadụ iri bụ ndị na-apụnarị ndị mmadụ akpa ha n’ike n’ọdụ ugboala dị iche iche na steeti Anambra.

 

Ndị nta akụkọ chọpụtara na ndị omekọme ahụ na-eyi ndị mmadụ bi n’okirikiri Ogidi, Nnewi, Onitsha na Ihiala egwu kemgbe eri oge. Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze na ndị uweoji na steeti ahụ, Haruna Mohammed, onye nke kwetara na akụkọ a bụ eziokwu kwuru na a ga-akpụghari ndị omempụ ahụ nso nso a.

Ọ kwuru si ‘site n’izuụka gara aga ruo ugbu a, a nwụchikọọna ihe kariri mmadụ iri bụ ndị na-apụnari mmadụ akpa ha n’ike n’okirikiri Ogidi, Nnewi, Ihiala na Onitsha. A natakwara ha ihe dịka ekwenti, ‘TV’, ogbatumtum na egbe.

Ọ gakwara n’ihu kọwaa na n’otu oge ahụ, na a nwụchikọkwara otu ekperima onye nke na-ezu ohi nke ya n’ọdụ mmanụ ugboala ‘filling station’, bụ onye nke e nwetara egbe Ak 47 n’aka.

Mohammed kwukwara na ọ bụ eziokwu na arụ zuru ebe nile mana ha tinyere ndị ọlụ nchekwa dị iche iche na steeti ahụ na-anwa oke ha site na nkwado nke gọọmenti steeti ahụ na ọtụtụ ndị ezigbo mmadụ nọ na ya iji belata mpụ na arụrụ ala na steeti ahụ n’ebe ọ dị ukwuu.

Ọ gara n’ihu kwuo na site na mbọ dị iche iche kọmandi ahụ na-agba site na ntụzi aka Kọmishọna uweojii, Garba Baba Umar, na mkpamkpa nke ndị omekome na-akpa na steeti ahụ ebelatago nke ukwuu.

GUO:  Ndị Uweojii ejidela ndị ohi atọ n'Anambra

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here