Nwokorobịa etigbuola nne ya maka ịkwasa nwanne ya iko

0
591
ọchụ

Blessing Nnabuife

 

OTU nwoke gbara afọ iri abụọ na abụọ, nke aha ya bụ Agaezichi Ogbonna, egbuola nne ya n’ihi ihunanya nke dị n’etiti ya na nwanne nne ya.

Nke a mere n’Akpaa Mbato, nke dị n’okpuru ọchịchị Obingwa, n’steeti Abia.
Ozi e nwetara site n’aka ezinaụlọ ha kwuru na Agaezichi na-enwebu mmekọ nwoke na nwanyị (‘love affair’), nke jịkọtara ya na nwanne nne ya.

Ka o sila dị, nne ya dọrọ ya aka na ntị gbasara ya bụ mmekọ n’ihi na dịka o siri kwuo, na ọ bụ arụ n’ala Igbo.

Nwanyị ahụ nwụrụ anwụ ka e kwuru na o nwetere ha n’ụlọ ka ha na-enwe mmekọ ma dọkwaa ha aka na nti ka ha hapụ imezi arụ mana nwa ya nwoke bụ Agaezichi dakporo ya ma tigbuo ya.
Mgbe ha chọpụtara na nwanyị ahụ anwụọla, akụkọ kọrọ na mmadụ abụọ ahụ gbapụrụ mana aka ndị ntorobia kpaara Agaezichi ma hafee ya n’aka ndị ọlụ agha bụ ndị nke bi n’ogbe ahụ.

Otu onye ezinaụlọ ha ọzọ kọwakwara na oteela aka Agaezichi na nwanne nne ya ahụ ji enwe mmekọ ma kwukwaa na mgbe ọbụna nne ya gwara ya maka nke a, ọ na-eti nne ya ihe.

“Onye ọbụna n’ogbe a na-ado Anaezichi aka na ntị banyere mmekọ ahụ n’ihi na ọ bụ arụ n’ala Igbo.Oge ọbụna nne ya dọrọ ya aka na ntị banyere nke a, ọ na-eti nne ya ihe. Ọ bụ maka nke a ka o jiri tie nne ya ihe, o wee daa n’ala, nwụọ”.

Onye ọlụ agha nke achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na a hafeela onye ogbu ọchụ ahụ n’aka ndị uweojii.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here