Ụmụ nwanyị ‘Christ Ascension’ e meela Ụka Nne

0
640
Ụka Nne

Uchenwa Mba

 

ỤMỤ nwanyị ‘Christ Ascension Church (CAC), Awka Area’ mere mmemme ụka nne ha ụbọchị ụka. Ndị ngalaba C.A.C, Ifite Awka (‘Land of Dotan’) merubere mmemme ha n’ụzọ pụrụ iche.

Ha nwere isi okwu a ‘Kpọlite Anyị Chukwu (Revive Us Lord). Ndị ngalaba ‘Land of Dotan’ malitere memmme nke ha n’abali iri na otu nke ọnwa a, wee weta ya na njedebe n’abali iri na asatọ. Mmemme a bụ nọọ nke ọtụtụ mmadụ bịara were anya ha gbaara onwe ha ekeresimesi.

Ha nwere ọtụtụ ihe egwuruegwu, ihe ngosi na abụ dị iche iche ha jiri mee ka ndị mmadụ na enwe ọńụ. Isi okwu nke afọ a gbasatara ịda mba dị n’oge a na ebe ndị nke na ekpere Chukwu, ọ kachasi n’ebe ụmụnwanyị, bụ ndị na- agbasi mbọ ike n’iso Chukwu nọ.

N’okwu ndụmọdụ nke onye isi ụmụnwanyị nke ọgbakọ gburugburu ụlọ ụka ahụ bụ ‘Elder Mrs’ Nyegi Madike, sịrị na ụmụnwanyị na-adazị mba n’ikpere Chukwu, na ha na-achụsozi nani mkpa nke ha, juzie oyi na nke Chukwu. Ọ sịrị na ndụmọdụ ya bụ na tupu ekwube okwu mkpọlite, na ọdidamba adigo; na ike na-agwụzị ụmụnwanyị ịga ozi ahụ ha malitere ije site na mbụ.

Madike kwuru na mbụ, na ọ bụ ụmụnwanyị bụ ndị Chukwu ji eje ozi na nzụkọ dị iche iche mana ugbua, a na-ahụzi ihe na ekwesighi na nzukọ kraisti site n’otu a na-esizi eje ozi ahụ.
“Ụfọdụ ụmụnwanyị na ibe ha dị n’iro, ezi mmekọrita adịzịghị n’etiti ụmụnwanyị. Nke a mere na ije ozi ahụ adịzịghi nfe”

Onye isi ụmụnwanyị na C.A.C Ifite Awka bụ Hannah U. Mba gwara ụmụnwanyị ka ha laghachi azụ n’ịgba mbọ, na ihe nile nke ha na-achọ dị n’aka Chukwu; na ọ ga-emere ha ihe nile ha na-achọ. O jikwa ọtụtụ ebe dị iche iche n’akwụkwọ nsọ gba ụmụnwanyị ume.

GUO:  Ụka Nne

Nwunye onye ọzụzụ atụrụ bụ ‘Rev. Mrs’ Favour Ogechi Egeonu, sịrị na obi dị ya ụtọ nke ukwu ịhụ ihe nile ụmụnwanyị mere na mmemme ahụ ma gwa ndị na-ararụ ụra ka ha teta ma bilie gaara Chineke ọzi mgbe ha dị ndụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here