A na-eleba anya n’ọnọdụ nchekwa ọda ụgbọelu Enugu ugbua

0
543

Chinwendu Uzoatu

 

NdỊ otu nnyocha nke a kpọrọ ‘Airport Council International’, awụchaana n’ọda ụgbọelu ‘Akanu Ibiam International Airport’ Enugu na Monde maka ileba anya n’ọnọdụ nchekwa nke ọdụ ụgbọelu ahụ.

Mgbe ndị ‘Airport Excellence (APEX)’ mechara nnyocha maka nchekwa nke ọdụ ụgbọelu a, ha ga-agba nke a n’anwụ.

N’okwu ya ka e mechara mmemme iji malite nnyocha a n’ọdụ ụgbọelu ahụ, onye isi otu APEX bụ Mazi Brahim Lakhlifi, kọwara na nnyocha a ga-enye aka ime ka ọdụ ụgbọelu a ruo ogo na nchekwa dịka mba ụwa si chọọ.

Dịka o siri kwu, nke a ga-enyere otu ‘ACI’ aka n’ịkwalite usoro nchekwa iji dabaa n’usoro nke ndị ‘International Civil Aviation Organisation’.

Ọ kọwara na ngalaba nile nke a dị n’aka na mba Africa ahọpụtala ndị otu nchekwa APEX maka nnyocha nke ọdụ ụgbọelu nile n’Africa.

Lahklifi gara n’ihu kwuo, “usoro nnyocha nke APEX bụ iji nyere ọdụ ụgbọelu dị iche iche aka ịchọpụta ebe a ga-akwalite ya na imezi iwu nke ndị ngalaba na-ahụ na njem nke mba Africa tiri na nzụkọ ha mere n’Abuja nke kwuru na ọdụ ụgbọelu ọbụla ga-agbaso usoro nnyocha a, tupu ngwụcha afọ 2022.

“N’otu aka ahụkwa, ICAO ekwuola na tupu a ga-ewepụta ọdụ ụgbọelu ọbụna maka ituru ugo, na ọ ga-agaferiri usoro nnyocha ndị APEX.”

Lakhlif kwukwara na ndị otu APEX bụ ndị gụnyere ndị si n’ọdụ ụgbọelu dị iche iche n’ụwa ga-anọ n’ọlụ a ruo echi bụ Fraidee bụ mgbe ya bụ nnyocha ga-abịa n’isi njedebe.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here