Abụ maka Naịjirịa

0
681
Awuufu, Abụ maka Naịjirịa
  • Awuufu

 

Pita Ejiọfọ

AWUUFU!, Awuufu!, ọ bụzị gị mụrụ Naịjirịa?
Wuruwuru bụrụ ndụ anyị, anyị na-ebihierịzị aka,
I jirị egbe, jide mma, na-emenye Alaanyị egwu,
Ọ naghị ebu, ọ naghị ata, añụrị na udo adịghị.

 

Awuufu, awuufu; onye ilo, aha gị dịgodụ egwu,
Ọ bụ Igbo,Yoruba, ọ bụ Hausa, mmadụ amaghị,
Mgbe ndịọcha narịị achị, ka ị mịbatara, ka puusu,
Ma sorụzịa ndịọcha laa, ị jụ, kụzịa akwụ n’ebe a.

 

Ma mgbe ahụ ihere ka na-eme gị, ka agbọghọ ọfụụ.
A na-eri gị, ma a na-ezo ezo, ma n’inye ma n’ịnara,
Lee anya n’ihu, lee n’azụ, tupu e rie gi mgbe ahụ,
Jee n’akụkụ ụzọ, che azụ, nyụsa gị ka amịrị n’ala.

 

Anya ka e ji okwu okwu mgbe ahụ, zotaa gị mmiri,
E ji akpọ gị “akaazụ” mgbe ahụ, ma ọ bụzịghị ugbua.
E jide onye riri gị, e mesie ya ike, ọ bụghị na o mere arụ,
Ọ bụ na o fichaghịọnụ ka nkịta, mgbe o richara nsị.

 

Ị dị n’ọdị dị icheche, ma na-aru ngwulangwu ebe ọbụla,
Mgbe ụfọdụ naanị ụra ka a ga-ehi, ihe dị egwu emewezie,
Mgbe ọzọ, ọ bụrụụlọ elu ka a rụchaara, nyezie ha kii,
Nwee ike bụrụ garị, ube, na ọkwa, ka a natachara n’ụzọ.

 

Ugbua, Ị baala ebe ọbụla, a mazịghị ihe a na-ahụ,
Bido na ihu nuzpepa ruo n’azụ, maka gị ka a na-ekwu,
Nde kwuru nde naịra na dola, ka otu onye richara,
A nụkata maka ego e riri, ndị mmadụ ana-ele moo.

 

Taa, a na-ejidezị awuufu n’aka, na-efere mmadụ aka,
Ị rịgotala n’ọkwa, bụrụzịa iri n’ime narị (10%),
Chamcham, ụfọdụ abụrụkwuo, iri nri rachaa ofe,
E binye aka, e kee ego ọrụ, ma a rụghị ihe ọbụla.

GUO:  Abụ maka Naịjirịa

 

O nweghị Gọọment Naịjirịa, awuufu akụjisịghị aka,
Bido na nke Balewa na Azikiwe, ruo na nke Buharị,
Mgbe ochie, nanị nwoke na-eri, nwany[ esoghị ha,
Ma ugbua, ihe nwoke na-eme, mwanyị narịị emekarị.

 

O nweghị ebe e zobeghịego awuufu na Naịirịa,
A fọjuola ya n’akpatiọzu, ụmụnwanyị bere akwa, na-aga,
E edowela ya na palọ ụlọ, sị na palọ bụ ọbaego Steeti,
E zoola ya na “tank” mmiri, dee ya, “ihe na-ewu okụ”.

 

O nweghị ụdị akụkọ anụbeghị maka awuufu n’oge a,
Na be Ọkaikpe Ekem, e butara akpa kwuru akpa dọla,
“Agwọ” lokwuru nde kwuru nde, ego awuufu na Naịjirịa,
Ndị e zigara ha natakwa ego awuufu, anapụta, rie ya.

 

Na Swizaland ka a na-ebugawabu gị, na e rikata,
E mechaa, bugawakwuo gị n’Amerika na Briten,
Megziko na Saụt Amerịka, sokwu n’ebe mgbaba gị,
Ma oge a, mbaụwa ndị Arab bụzị, ebe ahụ doro gị.

 

Ị bụzị omenaala taa, ma I jọgburu udene sigbuo nkakwụ
Ọgaranya ji-anara ogbenye awuufu, tinyekwuo na njeri ya,
E ji annara ajadu awuufu, wee bunyekwa ya ozu di ya,
Narakwuo anamaachọọrụ awuufu, tupu e nye ya ọrụ.

 

Awuufu bụ na dimkpa furu,fụnyụọ anya, anọzịghị nkụ ya,
Bụrụna e weere onye emeghị ihe ọbụla, kpọchie na “seelụ”,
Ya ka a na-erikata, muchie anya, chie ekperima ọzọ,
Chere ụzọ emebikwuo, gwepịawa mmadụ, awuufu ewee buo.

 

Awuufu bụna onye a tụghọrọ vootu, mechaara merie,
Ya bụna onye eleghị ule, nwere “kredit” asaa,
Bụrụna Gooment mefuo nde naịra, ihe a rụrụ a hụghị,
Ya bụ isi njini arụna mpụ nile a na-eme na Naịjirịa.

 

Jirikwa ma n’ike mọọbụ vootu, gbanwoo ọchịchị,
Dewekwa iwunjikọ kwuru iwunjikọ, e dechaa, e bidokwa,
Rụwakwanụ mahadum na Naịjirịa, ha bachaa obodo ọbụla,
Ha dum bụkwa n’efu, na e gbughị Awuufu na Naịjirịa.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here