Agụmagụ odinala ndị Igbo

0
1483
Agụmagụ odinala

Victor Maduagwuna

 

AGỤMAGỤ odinala bụ echiche miri emi nke nna nna anyị chere banyere isiokwu dị iche iche ma were asụsụ nka kọwapụta ya.

Agụmagụ odinala abụghị akụkọ e deturu edetu n’akwụkwọ n’ihi na ndị nna nna anyị ha bụ ndị na-akọ ya amaghị ede nke ha ji ama agụ akwụkwọ. Ọ bụ ọnụ nkiti ka ha ji akọrọ ụmụ ha nakwa ụmụ ụmụ ha, ụmụ ha sikwa otu ahụ kọọrọ ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha. Ọ bụ nwa nwa tota o tokwuru. Agụmagụ ọdịnal ndị Igbo dịka omenala ha. Ọ na-esi n’aka efere n’aka.

Ma n’oge ugbua, n’ihi mmuta, agụm na edem akwụkwọ ndị Igbo nwebegoro, nakwa ọgbara ọhụrụ dị iche iche, ndị ọkammụta ụfọdụ chịkọbara ụfodụ n’ime akụkọ ndị a, ma dee ha n’akwụkwọ. Ebumnobi ha bụ ka akụkọ amamihe ndị nna nna anyị ha ghara ifu n’anya anyị. Ha mere ya maka ichekwa ha na omenala ndị Igbo.

Na e deturu agụmagụ odinala n’akwụkwọ emeghị ka ọ bụrụ agụmagụ ugbua, kama ọ busị agụmagụ odinala ndị e dere ede n’akwụkwọ.

Agụmagụ odinala na-apụta ihe n’ọkpụrụkpụ uzo atọ ndị a, akụkọ, ejije ma ọ bụ egwuriegwu, nakwa abụ. E wezuga ọkpụrụkpụ ụzọ atọ ndịa, agụmagụ odịnala si pụta ihe, ọ na-apụta ihe n’okwu nka ndị Igbo ndị a: Ilu, Agwugwa, Okwuntabire, Ụkabụilu na Asinilu.

GUO:  Uru agụmagụ ọdịnala bara

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here