Ahịa mbugharị e gwu eji taa

0
610

Chinwendu Uzoatu

 

AHỊA mbugharị, nke bekee kpọrọ ‘hawking’ abụrụla egwu e ji ugbua n’ala anyị. Ọtụtụ ndị mmadụ bagidere nke a iji wee mara ma ihe ọ ga-aka mma n’ihi na a sị n’afọ ekweghị ụkwụ zuo ike.

Ahịa mbugharị pụtara mmadụ ibu ahịa na-agaharị agaharị, ebe ụfọdụ na-akpọsa ahịa n’akụkọ ụzọ. Abịa n’ebe ndị na-agaharị agaharị nọ, ụfọdụ na-akwa ya n’ihe ọkwụkwa ma na-akpọku ọha na eze ka ha zụrụ ahịa. Nke a mere na ị ga na-anụ ka ha na eti mkpu na-asị “ọkpa dị ọkụ; oroma ụtọ n’ebe a; goonụ ọka na ube; oyoyo raịsị wdg.

Ma okenye ma ụmụaka na-azụ ụdị ahịa a. Mgbe ụfọdụ ka a na-ahụ ụmụaka ka ha na-ebughari ahịa ebe ụmụaka ibe ha nọ n’ụlọakwụkwọ. Nke a wee bụrụ ihe jọgburu onwe ya n’ihi na ihe niile nwere oge. Mgbe ụfọdụkwa, ụmụaka erubeghị ogo ịzụ ụdị ahịa a ka a na-ahapụkwa ha a na-azụ ya. Ọtụtụ ụmụaka ụmụagbọghọ esila n’ụzọ dị otu a tụta ime mkpuke n’ihi na ụmụnwoke ndị omekome na-esite n’ụzọ aghụghọ n’ụdị na ha na-azụrụ ha ahịa wee mebie ha.

Ọ bụ eziokwu na uru dị n’ahịa mbugharị, ma ọghọm dị na ya kariri makana site n’ịzụ ụdị ahịa a, mmadụ nwere ike zute ọnwụ ya na mberede.

O nwere otu akụkọ a kọrọ n’oge gara aga, na otu onye na-ere unere ka a kpọrọ ka o buru ya bata n’ime ụlọ ebe a na-alụ ụlọ ọhụrụ. Akụkọ ahụ kọrọ na e gburu onye ahụ, ọ nwụọ ma mmadụ amaghị. Mgbe a rụchara ụlọ ahụ, ndị mmadụ kwabatara na ya biri mana nsogbu dapụtaziri n’ikpeazụ. Nsogbu ahụ bụ n’abali ọ bụna ha labaa, ha a na-anụ olu na-eti mkpu na-asị “goonu banana! goonu banana!”. Otu a ka ọsọ siri gbaa n’ụlọ ahụ, eziokwu wee pụta ihe.

Ka o sila dị, a gbara ọtụtụ ndị na-azụ ahịa mbugharị ajụjụ ọnụ, otu a ka o siri ga: Okeke Chinonye bụ nwa agbọghọbịa na-azụ ahịa mbugharị. A hụrụ ya ka ọ kwa akwa dị iche iche na baro na-agagharị agagharị. O kwuru si “Ana m eme nke a n’ihi na m nọrọ otu ebe, ndị mmadụ na-eji m ụgwọ mana m na-agagharị, ha na-azụ na-akwụkwa ụgwọ n’ihi na ụzọ dị otu a na-eme ka m na-ere ya ọnụ ala.

“Azụọla m ahịa a ihe kariri afọ atọ. A na m esikwa n’ego m na-enweta na ya na enyere onwe m aka tinyerekwara ụmụnne m.” Otu nwata akụkwọ nwanyị nọ na Junịọ Sekondịrị ogo nke atọ (JSS 3), aha ya bụ Blessing Ani ka a hụrụ ka o bu ube okpoko na-aga n’ụzọ awara awara si Enugu gaa Onitsha. Mgbe ahụ a gbasaana akwụkwọ, ọ laa, gbanwee akwa akwụkwọ ya ma buru ahịa ya kpagharịba. O kwuru si; “Ana m ebugharị ahịa a iji nyere nne m aka n’ihi na nna m anwụola. Ọ bụzi so nne ma na-elekọta mụ na ụmụnne m anya, nke a mere na amalitere m ahịa ka m wee na-akwụrụ onwe m ụgwọ akụkwọ.”

 

Otu nwanyị kọwara onwe ya dịka Chinyere, onye nke kpọsara ahịa na njiko ụzọ a kpọrọ ‘Regina Caeli Junction, Awka,’ kwuru si na ya enweghị ego ịkwụ ụgwọ shọọpụ. Ọ kọwara na ọ bụrụ na ya nwere ego na ya gara akwụ wee nọrọ n’ọdụ ahịa dị mma. Ọ kọwakwara na ọ na-ezute ihe nhịa ahụ site n’ikwapụta ahịa ụtụtụ na abalị nile tinyekwara na mmiri na anwu na-echere ya aka mgba.

Otu nwoke (achọghị ka a kpọọ aha ya) nke kpọsara ahịa nke ya n’ugboala na-akọwa na ya enweghị ego ịkwụ ụgwọ ọdụ ahịa tinyekwara ego weta weta a na-ana ndị nọ n’ọnụ ụlọ ‘shọọpụ’. O kwuru hoo haa na ọ bụ nke a mere ya ji jiri ụgbọala ya mere shọọpụ n’egbughị oge obụna makana onye arachaghị ọnụ ya, ụgụrụ arachaara ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here