E toola gọọmentị Anambra maka iji ụgbọala nọchie anya ọkada

0
511
Asusu Igbo

Izunna Okafor dere akụkọ ndị

 

OFU òtù a maara dịka “APGA Media Warriors” etoola gọọmentị Anambra maka nkwa ahụ e kwere iji ụgbọala wee dochie anya ọkada n’Awka nakwa Onitsha, bụ ebe o kwuru na ndị ahụ ji ọgba tum tum akpa ego agaghị agbazịkwa na ya malite n’abalị nke mbụ n’ọnwa Julayị afọ a.

Onye nhazi ndị otu ahụ, bụ Mazị Chinedu Obigwe mere ka a mara nke a ụbọchị Tuuzdee n’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ, ma kwuo hoohaa na nke ahụ bụ nnọọ atụmatụ magburu onwe ya, n’ihi na ọ bụghị naanị na ọ ga-eme ka ndị ahụ ga-akwụsị ọlụ ọkada nwee ihe ọzọ ha ga-eji na-aracha mmanụ, kama na ọ ga-enyekwa aka n’ịkwalitekwu ezi ọnọdụ akụnụba steeti ahụ, ma ọ bụrụ na ha nweta ma malite iji ụgbọala ndị ahụ akpa ego.

 

O mere ka a mara na site na nkwa ahụ Gọvanọ Obianọ kwere ịzụta ụgbọala dị otu puku n’ọnụ ọgụgụ maka ndị ọkada ahụ, na ya bụ gọvanọ egosipụtala onwe ya dịka ezi nwoke nwere mmetụta banyere ọnọdụ ụmụ mmadụ n’obì, ọ bụnadị dịka ọ mapụtaworo ọnụ ego dị narị nde naịra asaa, na ụma iri isii na ise maka ịzụta ya bụ ụgbọ ala.

 

Ọ gakwara n’ihu kwuo na ndị Anambra nwere chi ọma wee nweta ezi onye ọchịchị dịka Gọvanọ Obianọ, bụ nwoke zuru oke ma nwezuo ihe niile a chọrọ n’iwèta ezi ọchịchị, bụkwa nke o gosipụtaworo site n’inwogharị ọnọdụ akụnụba steeti ahụ, ịkwalite mmepe ime ime obodo, itute ngalaba ọlụ ugbo, ịwèta ezi nchekwa ndụ na akụnụba, ime steeti ahụ ka ọ bụrụ ebe mbụ a na-elegara anya n’iwunye ihe mwunye, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ o mepụtagoro.

GUO:  Ọchịchị Obiano: Ihe na-atọkarị m

O kwuru na ọlụ ọma ndị a o ji n’aka na steeti ahụ ugbu a bụ iji mezupụta ma kwụghachi ezi ntụkwasị obi ahụ ndị Anambra nwere na ya site n’ịtụnyere ya ka ọ chịa nke ugboro abụọ na nhọpụta ahụ e mere n’afọ gara aga, bụ nke o tutere ugo n’okpuru ọchịchị iri abụọ na otu e nwere na steeti ahụ.

Ọ kpọkuzikwara ndị ọkada na steeti ahụ ka ha kpara ya bụ ọjị nkụ site n’iji ohere ọma ahụ wee kpọọrọ ihe ma sonyesie ike na ya maka na onye chụpụrụ onwe ya n’ụgbọ apụghịkwa ịsị na ụgbọ eruteghị ya, tinyekwuoro na ụdị ohere ahụ abụghị ihe na-adapụta kwa oge, kama otu ugboro na ndụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here