Ibelata ntaramahụhụ a na-enye ndị aka ha dị ọcha

0
691
ntaramahụhụ

Uchenwa Mba

 

ỤWA anyị nọ n’ime ya dị mma ma ọ bụrụ na ị nọ n’ahụ ụtọ, inweghị nsogbu ọ bụla, mana ọ bụrụ na ịnọkata nwee nsogbu ọrịa, ọnwụ, ọkwunaụka, agha, mgbe ahụ ka ị ga amara na onweghị ihe dịka ịnọ na udo n’ahụ ike.

N’ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa June,ya bụ nwanne ụnyaahụ, ka e merubere mmemme ụbọchị ndị dabara na nsogbu nke ha maara ma ọ bụ nke ha amaghị isi ya ewee na ata ha ahụhụ ka ha wee kwere na ha mara ihe a na ekwu maka ya.

Oge ụfọdụ, ejide onye ohi, ọ na-agọ na ya ezughị ohi n’aka ya dị ọcha. Ọ bụrụ onye ohi enweghị obi ike, a taa ya ahụhụ batara ya ahụ,o kwere na ya zuru ori ahụ mana ọ bụrụ nke obi siri ike, ọ gaghị ekwe n’agbanyeghị ahụhụ ọ bụla a ga enye ya.

Oge ụfọdụ, ihe fuo, a chikọrọ ndị nile nọ ebe ahụ nye ha ntaramahụhụ jọrọ njọ ka ha wee kwere na ọ bụ ha mere ihe ahụ a na ekwu maka ya. Ndị uwe oji maara ụdị ntaramahhụ ha ga-enye mmadụ, o kwuo nke bụ eziokwu achọrọ n’aka ya.

Mana ahụhụ nke a na-ekwu maka ya ugbu a bụ nke ọdịghị ihe onye ahụ mere a na-ata ya ahụhụ. Ọ bụrụ na agha dị, ndị otu agha ọ bụla jidere ndị otu agha ibe ha na ata ha ahụhụ jọgbụrụ onwe ya ka ha mara na ha ka karịrị ha. Ha nwere ike igbupụ ha aka ma ọ bụ ụkwụ iji gosi ha nkarị.

Ndị ọzọ na-ata ndị dabara n’aka ha ahụhụ bụ ndị ntọrọ mmadụ. Ha na-ata ndị ha jidere ahụhụ ka ha wee nye ha ihe nile ha chọrọ n’aka ha. Ha na-eji mma ma ọ bụ aka tie ndị ahụ ihe tinka tiri panụ. Ha na-eke ha agbụ, a dịghị enye ha nri ma ọ bụ nye ha mmiri mgbe ọ gụrụ ha, a na eke ha agbụ tọgbọ ha n’ọhịa.

Ndị n’agba ọsọ agha oge ụfọdụ na-adaba na mmekpa ahụ dị otu a, ọ kachasị ụmụnwanyị. Ụmụnwoke, ndị kporo onwe ha ndị isi ha na-enwere ha emere ihe dị ha mma. Ha na-ama ụmụnwanyị na ụmụagbọghọ elu mgbe ọ bụla ha chọrọ, ma ụmụnwanyị ahụ ọ chọrọ ma ọ bụ na ha achọghị.

Ndị a kpọrọ onwe ha ndị isi ha na-emekpa ha ahụ n’ụzọ ekwesighị n’agha. Ndị isi a na-eti ha aka otu ọ bụla ha chọrọ, na-enye ha ntaramahụhụ ọ bụla jọgbụrụ onwe ya.

N’ezie , ọ bụrụ na ilee ihe onyonyo mgbe a na-agba ohu, ị ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ nke a na-enye ndị a kpụ eje ire. Ha na-ewere inyagba ejikọ olu ndị ahụ nile, ma nwoke, nwanyị, ikorobịa na agbọghọbia ma ndị kara nka. Ọ gbasaghị ndị ike a ma ndị ha ji ọ ga-anwụ. Ọ bụghị nanị nke ahụ, ndị ike a na amakwa ụmụnwanyị elu mgbe ọ bụla ha chọrọ.

Oge ụfọdụ, ejide mmadụ n’ihi na omere otu ihe ma ọ bụ nke ọzọ, ọ bụrụ na onweghị onye ga-ekwuru ya ọnụ ya, ha ataba ya ahụhụ n’ụzọ jọgbụrụ onwe ya. N’ụbọchị Tuzudee ka ọnwa Jun dị n’mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na isii nke afọ a ka e mere mmemme nke ndị bekee kporo ‘International Day In support of Victims of Torture’.

Ndị na-achikọba mmemme ahụ na-anọrọ n’ụbọchị ahụ kọọrọ ndị mmadụ ọghọm dị n’oke ntaramahụhụ a na enye ndị mmadụ oge ụfọdụ. Ha na-anọrọkwa na mmemme ahụ kọwakwara ndị mmadụ otu a ga-esi gbochie ụdi obi ọjọọ ahụ maka n’oge ụfọdụ, oke ntaramahụhụ ahụ na-ebute ọnwụ nye ndi a na ata ahụhụ ahụ.

N’afọ ole gara aga, anyị nụrụ maka ụmụakwụkwọ mahadum ejidere naRivers Steeti, gbuo ha ma suo ha ọkụ. Ihe dị otu a na-eme n’akụkụ obodo anyị dị iche iche. Ntaramahụhụ a dịkwa na ogige ndị uwe ojii nile dị n’ala anyị.

Ọ dị otu nwanyị nke m mmara bụ onye ọlụ na-elekọta ahụ ike. N”ihi na ndị ya na ya bi kpọrọ ya asi, ka ha wee megide ya, ha kpọọrọ ya ndị ọlụ uwe ojii pụrụ iche a na-akọ ‘SARS’ sị na nwanyị ahụ na-amụ nwa na-ere. Mgbe a kpụrụ nwanyị ahụ, ndị SARS emeghị nyocha ha nke ọma tutu ha taba nwanyị ahụ ajọ ahụhụ. N’ikpeazụ, nwanyị ahụ emeghi ihe dị otu ahụ mana o riri ahụ ụfụ jọgburu onwe ya n’aka ndị ahụ bịara kpụrụ ya tutu ha hapụ ya.

Okwesiri ka onye ọ bụla e jidere maka omume ọ bụla a na-enyo enyo, ka e mee ezigbo nyocha tupu a taba ya ahụhụ. Gọọmenti kwesiri ime ya ka ọ bụrụ iwu n’onye ọbụla ejidere ka ọ na-ata mmadụ ibe ya ahụhụ ọjọo ka a kpụrụ onye ahụ ma takwa ya ahụhụ nagbanyeghị onye ọ bụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here