Igbusi ndị mmadụ na Plateau: Onye kwuru na m gbara nkịtị? – Buharị

0
572

ONYEISI ala anyị bụ Muhammadụ Buharị akọwaala ya dịka nkọghèri na asị ocha ghe anya oghe, bụ akụkọ ahụ ndị mmadụ na ebugharị na-asị na o nweghị ihe ọbụla nwere isi o kwuru banyere mgbusi ahụ e gbusiri imirikiti ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha na steeti Plateau n’izu ụka gara aga site n’aka ndị Fụlani, ma gọọ aka na ọkpa ya banyere nke ahụ, ọ bụnadị dịka o mere ka a mara na o kwuru ihe o kwesiri ikwu.

 

Nke a bụ nke e mere ka ọ pụtakwuo ihè site n’aka nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye ya bụ onyeisi ala na mgbasa ozi, bụ Mazị Garba Shehu, bụ onye mekwara ka a mara na Buharị kwuru okwu banyere mgbusi ahụ oge ya na ndị e ji okwu ha agba izu na Jọs nwere nzukọ iji kpaa banyere nke ahụ.

Onyeisi ala n’onwe ya bụ Buharị akatọọla kpam kpam otu ndị mmadụ si ekwu na o nweghị ihe ọ bụla nwere isi o kwuru banyere ọnọdụ ahụ n’ihi na ya onwe ya dịkwa ka otu onye n’ime ndị Fụlani ahụ na-achị ehi; o wee kpọkuo ụmụafọ Nigeria ka ha ghara ịña ntị n’akụkọ ahụ ọ kọwara dịka nke enweghị isi na ọdụ, dịka o kwuru na nke ahụ pụrụ ikposa udo na ezi mmekọrịta ahụ dị n’ala Nigeria.

O kwuru hoohaa na ya akatọọla mgbusi mmadụ ahụ dịka nke jọgburu onwe ya, ma kwuo na nke bụ ezi okwu bụ na dịka ya onwe ya siri mara, n’oge mbụ na Fụlani na-achị ehi adịghị ebu egbe, na ha adịghịkwa achọ nsogbu, ma sịkwazie na ọ gbara ya gharị na ihe ọ na-anụzị ugbu a bụ na ndị Fụlani gburu mmadụ, bibie ihe a kọrọ n’ugbo, ma ọ bụ mee otu ihe ma ọ bụ nke ọzọ adịghị mma na ntị.

GUO:  E jidela ụgbọala gwomgworo si Plateau buru ndị mmadụ bata Anambra

Onyeisi ala mezịkwara ka a mara na ya akpọkuola ndị ọlụ nchekwa ka ha kee nkwụchà iji hụ na ụdị akụkọ ahụ na ihe ọjọọ ndị ọzọ eselitezịghị isi n’ala anyị ọzọ. Ndị ọzọ sonyere n’ọgbakọ ahụ gụnyere gọvanọ steeti Plateau, nke Kebbi na nke Mina, minista na-ahụ maka nchekwa n’ala anyị, Mansur Dan-Ali; minista na-ahụ maka ihe na-eme n’ime obodo, bụ Maazị Abdulrahman Danbazzaụ; ogbò ya nke na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Laị Mọhammed; ndị ndu ụlọ nnọchianya na ụlọ ọgbakọ sineet ala anyị; ndị isi otu jikọtara ndị ụka; onyeisi ndị uwe ojii n’ala anyị bụ Ibrahim Idris, tinyere ndị ọzọ.

Otu ọ dị, otu jikọtara ndị ọlụ oyibo n’ala anyị bụ NLC akatọọla mwakpò ahụ n’ebe ọ dị ukwu, ma kpọkuo gọọmenti etiti ka o teta n’ụra ma lụọ ọgụ dịka nwoke iji wee weta nkwafu ọbara ahụ dị n’ala anyị n’isi njedobe maka na ya bụ ihe na-achọzị ịghọ omenala.

Onyeisi ndị otù ahụ n’ala anyị bụ Mazị Ayuba Wabba mere ka a mara nke a n’Abụja, ma kwuoo hooha na nke a ewetala ọtụtụ ọjọọ na mpaghara na ngalaba dị iche iche n’ala anyị, tinyekwuoro na ọ na-ebi ọnọdụ udo na ịdị n’otu ala Nigeria aka ọjọọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here