N’Orlu, agbagbuola otu onye eze

0
758

NDỊ Mgbe, nke dị n’okpuru ọchịchị Orlu na steeti Imo nọ na nnukwu egwu ugbua n’ihi ogbugbu nke e gburu eze obodo ha bụ Eze Bredan Ibekwe, site n’aka ndị oji egbe a na amaghị ndị ha bụ, ma bụrụkwa ndị a na-eche na e zinyere ha ka ha bịa gbuo ya.

Ozi ndị nta akụkọ nwetara na-akọwa na ndị oji egbe ahụ, mgbe ha gbuchara onye eze ahụ, buuru ozu ya pụọ mana e mechaara hụ ebe ha gbahapụrụ ya n’okporo ụzọ awara awara sitere Orlu gaa Oweeri.

Dịka onye kwuru okwu siri kwuo, ndị ahụ zuuru aka (bead) nke onye eze ahụ, ihe o na-agba n’aka, tinyekwara ekwentị ya.

Onye obodo ahụ, onye nke kwuru na ọ hụrụ mgbe ya bụ mkpamkpa kpara, kwuru na ndị ahụ gbara eze ahụ egbe ugboro ugboro ma mechaa buru ozu ya tinye n’ụgbọala ha wee zọpụ ije.
Ozi e nwetara site n’aka onye nkwupụta okwu ndị uwe ojii bụ ‘Police Public Relations Officer’ Andrew Enwerem, kọwara na nke a bụ eziokwu ma kwuo na a nwụchikọọna mmadụ abụọ maka’ọnwụ onye eze ahụ.

Ọ gakwara n’ihu kwuo na kọmishọna uweojii na steeti ahụ bụ Dasuki Galandanch enyela iwu maka nnyocha bụ ịgba maka ọnwụ eze ahụ.

Enwerem kwuru sị, “anyị nwetara ozi maka ogbugbu e gburu eze obodo Mgbe ma malite ọlụ ozigibo na ya bụ ebe arụ ahụ nọrọ mee. Ka ọ dị ugbu a, aka akparala mmadụ abụọ maka ogbugbu onye eze ahụ. Kọmishọọna akpọọla oku maka ileba anya nkeoma na ya. Onye achopụtara aka ya dị na ya ga ezute ihe iwu kwuru.”

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here