Onye ohi ekwuola na ọ malitere ohi maka ibido ụka nke ya

0
613
ọchụ

Chinwendu Uzoatu

 

AKA akparala otu abalịdịegwu,onye nke gbara afọ iri anọ na otu nke aha ya bụ Fidelis Nelson (aka MP), bụ onye isi otu ndị ohi bụ ndị nke na-akpa ike okirikiri steeti Lagos na Ogun.

Nwa amadi a kọwara na ihe tinyere ya n’ọlụ oji egbe ezu ohi bụ maka na ya chọrọ inweta ego o ji alụ ụlọụka ya ,
N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, Nelson,onye ji ụmụ atọ kwuru si, “Enwere m ọkpụkpọ oku ị bụ onye ụkọchukwu mana enweghị m ego iji bido ụka nke m. Enweela m ọkpụkpọ oku a ọtụtụ afọ mana ego adịghị iji mee ka ọ pụta ihe.”

Nelson, onye nke nọrọla n’isi ọtụtụ oge n’iji egbe ezu ohi kwuru na ya na ndị otu ya zuru ohi egbe ugboru atọ nso nso a. Ọ kwuru si, “Anyị natara ụgbọala atọ n’ọnwa gara aga.”

Iko ndị omekome a juru oge ndị uweojii nwetere ozi na ndị ohi bụ ndị nke na-anapụ ndị mmadụ ụgbọala ha n’ike na steeti Ogun na-aga Lagos ire ụgbọala ndị ahụ. Nke mere ka ndị uweojii chebiri ha.

Ka ọ dị ugbu a, aka akparala ndị ohi ahụ na Lagos. E nyere aha ha na afọ ha gbara dịka Emmanuel Ogaba (45); Matthew Ogaba (30); Fidelis Nelson (41); Augustine Stanley (31); Abayomi Adebisi (42) na Emmanuel Olusegun (37).

A natara ndị ohi a otu moto Toyota, otu egbe ụmụaka (toy gun) na ọtụtụ ‘sim’ kaadị. Onye isi ha bụ Nelson kwuru si: “Alụọna m nwanyị, jide ụmụ atọ. Abụ m onye ọkwọ ụgbọala a maara aha ya. Nwunyem amaghị na m na-ezu ohi.”

Ọ bụ mụ tinyere Augustine n’otu anyị. Enwere m nchekwube na mgbe m ga-amalite ụlọụka m, aga m eme ya onye isi ngalaba abụ n’ihi na o nwere onyinye amara ịbụ abụ.”

Dịka Augustine, onye nke si steeti Abịa siri kwu, “Abụ m onye na-abụ abụ ụka (gospel artiste). Ana m eme nke a n’ogbakọ ekpere, agbamakwụkwọ na ọtụtụ ihe mmemme dị iche iche.”
“Mụ na Nelson zutere n’otu ọgbakọ ekpere (crusade). Ọ gwara m na ka m si abụ abụ masiri ya na ọ ga-achọkwa ịkwado m na ya bụ njem abụ.”

“Na mmalite ọnwa a, Nelson gwara m ka m soro ya gaa ohi ka nrọ m wee pụta ihe.”

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here