A Dụọla ndị nne ka ha onyesie ike n’ọlụ mmepe obodo

0
601
Bishọọpụ Ibezim na nwunye ya, Martha (n'etiti) na ụfọdụ ndị bịara mmemme ahụ
Bishọọpụ Ibezim na nwunye ya, Martha (n'etiti) na ụfọdụ ndị bịara mmemme ahụ

Izunna Okafor

 

A dụọla ma kpọkuo ndị nne n’ụwa gbaa gburugburu ka ha cheta ọrụ ha dịka ndị mwulite na ndị nhazi ezinaụlọ, tụnye ụtụ nke ha ma sonyesiekwa ike n’ọrụ mmepe obodo.

Nwunye aka na-achị steeti Anambra bụ oriakụ Eberechukwu Obianọ nyere ndụmọdụ a ma kpọọkwa oku ahụ na nnukwu mmemme ọgbakọ izugbe nke ụmụnwaanyị ụka Anglịcan na Dayọsiisi Awka, bụ nke e mere n’ụlọ ụka St. Mark dị n’Ụmụawụlụ n’okpuru ọchịchị Awka Sawụtụ na steeti ahụ.

Ya, bụ nnukwu nwaanyị, nke onye nọchitere anya ya bụ nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ steeti ahụ n’ọrụ pụrụ iche, bụ Oriakụ Amaka Ezike, toro ndị chịkọbara ya bụ ọgbakọ, ma kọwaa na isonyesi ike n’ụdị ọgbakọ ahụ na ihe ndị ọzọ a na-achịkọba na steeti ahụ bụ nnọọ ezi ụzọ pụtara ihe esi anụcha ma na-eme ka ụmụnyaanyị bụrụ ndị e ji ama atụ ibi ezi ndụ n’obodo, ndị nhazi ezinaụlọ doro anya, na ndị kwụụrụ onwe ha.

O kwuru na ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ bụ ọchịchị nwere ezi ebumnobi banyere ụmụnwaayị, kpọpụtasịa ọtụtụ ihe dị iche iche ọchịchị ahụ mepụtaworo banyere nke ahụ, ma meekwa ka a mara na ụmụnwaanyị karịrị otu narị na iri ise na steeti ahụ bụ ndị na-esonye na ọmụmụ ọrụ aka dị iche iche, bụ nke na-ewere ọnọdụ ugbu a n’ụlọ ọmụmụ ọrụ aka “Mary Sumner Vocational and Training Institute Awka”. Ọ kpọkuzịkwara ha ka ha na-apụta apụta ma na-esonyesi ike n’ihe dị iche iche a na-eme na steeti ahụ, n’ihi na ọchịchị Willie Obianọ nwere ezi ebumnobi banyere ụmụnwaanyị.

GUO:  N’Awka, ndị Anglikan echenwòóla ndị nne n'ihu Chineke, doo ha nsọ

Na mbụ na nkenke okwuwchukwu ya n’ọgbakọ ahụ, bishọọpụ Dayọsiisi ahụ, bụ Bishọọpụ Alexander Chibuzọ Ibezim kọwara mkpa ọ dị mmadụ ịtụkwasị obi ya niile kpam kpam na Chineke n’ihe ọbụla ọ na-eme, n’ihi na ọ bụ naanị n’ụzọ dị otu ahụ ka mmadụ pụrụ isi merie ọnwụnwa na ihe ịmà aka niile dị iche iche ọ na-agabiga, ọ kachasị dịka o siri metụta ịgba ọsọ eluigwe nakwa ọnọdụ ala Nigeria nọ na ya ugbu a. Ọ dụzịkwara ha ka onye ọbụla dị njikere ma nọgidesie ike n’okwukwe ya maka na Kraịstị pụrụ ịbịa oge ọbụla.

Ndị ọzọ kwuru okwu n’ọgbakọ ahụ gụnyere: Oriakụ Chiọma Ibezim, bụ nwunye bishọọpụ dayọsiisi ahụ ma bụrụkwa ọchị ọra otu ụmụnwaanyị niile dị na dayọsiisi ahụ; osote ọkaokwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ, bụ Maazị Harford Oseke, bụkwa nwaafọ obodo Ụmụawụlụ; eze ọdịnala obodo ahụ, bụ Igwe Joel Egwuọnwụ; ụkọchukwu ụlọ ụka ahụ, bụ Cannon Vincent Nkemdịlịm, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Ihe pụtakarịchara ihe na mmemme ahụ bụ ịwa achịchị bekee e jiri merube ya, ịtụ mmamma, na abụ otuto dị iche iche a bụkuru Chineke.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here