Abụ maka Naịjirịa

0
581
Awuufu, Abụ maka Naịjirịa
  • Ọ Bụ iyi na-egbu

 

Pita Ejiọfọ dere nke a

 

IYI a na-añụ na Naịjirịa karịkwara akarị,­
Kwa izuụka, ụmụakwụkwọ niile ga-añụ,
Tupu a banye mahadum, iyi ka a ga-añụkwa.
A gawa ife alaanyị, añụkwa otu iyi ahụ.

Onyeisiala Naịjirịa ga-añụ, tupu ọ chịwa ala,
Akanaachị Steeti ga-añụ, tupu o were ọkwa,
Onye Ọkaokwu ọbụla, ga-añụ tupu o kwuwe,
Chineke ka a na-akpọ, ma iwu ka a na-emeju.

Onye Sineeti ọbụla ga-añụ, tupu o were oche,
Tupu ọ banye ụlọ nzukọ, ọnọchiteanya ga-añụ,
Ndị Ọchịchị Ime Obodo ga-añụ, tupu ha arịgolu,
Chineke ka a na-akpọ, ma iwu ka a na-emeju.

Ọkaiwu ga-añụrịrị iyi, tupu ọ bụrụ ọkaikpe,
Onye ụka họtara ga-añụ, tupu ọ bụrụ ụkọ,
Onye obodo họtara ga-añụ, tupu ọ bụrụ Igwe.
Dịrị gawa n’ebe niile, ọ kwa iwu ka a na-emeju.

E jezie n’ụlọ ikpe, ịñụ iyi ana-azụ ka ahịa,
A na-añụ ya ka ngwọ, jiri ya na-akpa ego,
Onye baa na “dọk”, ọ ñụọ tupu o kwuo okwu,
Ndị ọrụ anọrụ ebe dị icheiche, na-agbara ọha iyi.

O lee nkwa a na-ekwe, mgbe a ñụrụ iyi?,
Na a ga-akwụwa aka ọtọ, kwuo naanị eziokwu,
Mee onye ka e mere ibe ya, erighị akaazụ ọbụla.
Jiri aha Chineke rịọ, ka O nyere ha aka.

Ma a ñụchaa, ihe a ñụrụ n’iyi, otu abụ n’ezi,
Ihe ọbụla ị chọla, ị ñụraa iyi, e edee ya, nye gị.
Ị gbara afọọnụ, bụrụkwa taata, e edee ya, nye gị.
Ị kụwaghị sleeti, nwee “Grade 1”, e edee ya, nye gị.

Mgbe ndị ñụrụ ịkwụwa aka ọtọ, banyezịrị n’ọrụ,
Ọtụtụ ejiri tipa buwe ego ọha, kpojuwe akpa ha.
Ndị ñụrụ iji ezigbo obi ha niile wee fee ọha,
Ejiri obi ha niile, megbuwe ndị esighị n’agbụrụ ha

GUO:  Abụ maka Naịjirịa

Onye ọbụla makwanụ, na ọtụtụ iyi ala anyị bụ asị,
Ma onye na-edu n’iyi, ma onye na-añụ ya añụ.
E werezịa aha Chineke na-agba bọọlụ, Ya sinụ
N’elu rịdata, kwuo, ma ọ bụrụ na ọ dị Ya njọ.

Iyi asị e ji aha Chineke añụ, sokwa egbu Naịjirịa,
Mere ihe jiri sie ike, a maghị ebe a na-eje,
Ndị Naịjirịa jiri biri n’akụnụụba, ma na-akọrị ahụhụ,
Ihe echi ga-eweta, o nwezịghị onye maara.

Oleenụ ihe anyị na-akparịrị Chineke otua?
Wepụnụ aha Chineke n’iyi, ka anyị yawa otu.
Kwuo naanị Ee, Mba; ka Akwụkwọ Nsọ siri kwu,
Ka iwe Chineke belata, ka Naịjirịa kunikwa.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here