E liela ozu nnenwanyị Obumse n’Onitsha

0
525

Uchenwa Mba

 

MMEMME elimozụ nke Caroline Anyanna Obumse bụ nke emere n’ụbọchị iri abụọ na iteghete nke ọnwa Julaị . Ndị ụka ‘Immanuel Church, Onitsha,’ bụ ndị kara ụka n’ụbọchị ahụ. Elimozu a bụ nọọ nke kpọkọtara ọtụtụ mmadụ site n’ebe dị iche iche n’ala anyị tinyere ndị ụkọchukwu dị ọtụtụ n’ọnụ ọgụ nke gosiri na nwanyị ahụ bụ onye ji ikpere Chukwu kpọrọ ihe.

Onye ụkọchukwu na okwuchukwu na okwu ndumodu o nyere ụmụ Mama Caroline sịrị ha hichaa anya ha, ma kasie obi n’ihi na ọ dị ndị amaghị nne ha.

Ka o nyesiri ha ndụmọdụ ahụ, o were sị na isi okwuchukwu bụ mmadụ ịdabere na Chukwu. O sitere n’akwụkwọ Mkpughe isi nke asaa, usoro nke itoolu ruo nke iri na asaa, mana okwukarịrị okwu n’usoro nke iri na atọ na nke iri na anọ. Ọ sịrị onye ọ bụla na- eje ije ọjọọ gbanwee mebe ezi ihe maka na mkpuru onye ọ bụla kụrụ, ya ka ọ ga aghọ ma oge ruo.

Otu onye ụkọchukwu aha ya bụ Rev. Edward Onuorah kpere ekpere. Rev. Onuorah lukwara ọlụ n’ụlọ ọlụ National Light
. Nwunye nwa Caroline bụ ‘Lady’ Nneka Obumse sokwa na-eru ụjụ .
Lady Nneka bụbu otu onye isi na ngalaba ‘Administration’ ANPC.
‘ Mummy Benin’,bụ aha e jiri mara ya bụ nọọ onye gụrụ akwụkwọ nke ọma, lụkwa ọlụ ya nke ọma ma zụkwa ụmụ ya nke ọma. Nwa ya nwoke bụ ‘Barr’ Reginald Obumse kọwapụtara ịgba mbo nne ha na ịdị uchu ya mana ụlọ, mana ụlọ ụka.

Nwa ya nwoke, Reginald gosiri ịgba mbọ nne ya site na ịsị ka-ewere ego enyere na onyinye wega n’otu nne ya so na ya n’ụlọ ụka.

Mummy Benin gbara mbọ dịka onye nkuzi.Ọ kuzikarịrị na ụlọakwụkwọ ‘primary’ na Benin, Agbo nakwa ọtụtụ ebe.
Na nkuzi ya, o luru ogogo nke ‘Vice Principal’ , na ogogo a ka ọnọrọ wee laa ezumike ọlụ.. Ọ gara n’ihu were ọlụ nke ikuzi oyibo (English teacher) na ‘Ebe Foundation Group of Schools, Benin. Ebe a ka ọ nọ ruo n’afọ 2017,oge ọ hapịziri ọlụ kpam kpam.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here