Nkuzi ahapụla ịbụ ọlụ ghọọ ọlụ e ji achụ ego

0
884
Nkuzi

Uchenwa Mba

 

ỌLỤ nkuzi so n’ ọlụ kachasi mma mmadụ nwere ike ịlụ maka na tutu ị bụrụ onye ọkammụta ma ọ bụ dọkịnta n’akwụkwọ ma ọ bụ ọlụ aka ọbụla, ọ bụ nkuzi ka i ji mara ihe ọbụla ị mara.

N’oge gara aga, a na-asị na ụgwọ ọlụ ndị nkuzi dị na eluigwe maka na ọ bụ ha na amalitere mmadụ ọbụla ka e si ede ma ka e si agụ. Ọlụ nkuzi bụ otu ọlụ mmadụ ga-alụ nwere ike ịkpọga ya eluigwe.

Ọlụ onye nkuzi bụ ime ka ụmụaka baa uru, na-agụ akwụkwọ ha. Ọ dịkwa ọtụtụ ihe onye nkuzi ga-amara ka owee nwee ike ikuziri ụmụakwụkwọ ya.

Onye nkuzi na-amalite mgbe nwata a ka amaghị aka nri na aka ekpe ya, na-egosi ya nke bụ aka nri, aka ekpe, isi, ukwu, ọnụ, wdg. Ọ bụ onye nkuzi na-amalite ịkuziri nwata abchd n’Igbo, ABCD n’oyibo.E wepu nkuzi, mmadụ nile a ka abụ iti na-eme ihe otu osi masi ha.

Ọ bụ nkuzi mere na nwata ọbụla na-abịa akwụkwọ, ọ wụọ ahụ ya, ma mmiri ọ na- ezọ ma ụgụrụ ọ na-eme.

Mana ọ dị ụzọ ndị nkuzi abụọ enwere n’ọgbọ anyị. Nke mbụ bụ ndị nkuzi maka ihụnanya ha nwere ebe mmadụ ibe ha nọ,mara ihe ma baa ezi uru na ihe nile ma ọ bụ ebe ọbụla ha nwetere onwe ha. Ndị nkuzi a ji ihunanya ha nwere na ọlụ ha alụ ọlụ. Ị kpọtara ha nwata amaghị akwụkwọ, ọ sị gị na ọ bụghị eziokwu na onye ọ bụla maara ihe kama na-aga akuziri ya otu ọ ga esi mara ma ọ bụ ghọta ihe ahụ.

Ndị nkuzi hụrụ ọlụ ha n’anya na-enwe mmasi n’ebe ụmụakwụkwọ ha nọ, na ejikwa obi umeala akụziri nwata ihe. Ihụ ndị dị otu a, ha na ndị ha na akuziri na-adị na mma nke ukwu. Ọ bụrụ na nwa ọ na-akuziri daa ule akwụkwọ, owute ya. Ndị nkuzi dị otu a na-enwe mmasi ime ka onye ọ bụla biara ha nso bụrụ mmadụ zuru oke.

Ndị nkuzi dị otu a, ebe ọ bụla ị hụrụ ha, ha na-egosipụta ihe ọma dị n’ime ha site ka ha si akpa agwa na ka ha si ekwu okwu ọ bụna. Ị baa n’ezinaụlọ ha, ị ga ahụkwa ihe dị iche.

Ndị nkuzi na-akuzi maka ego bụ ndị ọ na-abụ nwa akwụkwọ ha daa ule, ọ gbasaghị ha. Nwa akwụkwọ ha jụọ ha ihe ọmaghị, ọ sị ha gaa jụọ nne ha ma ọ bụ nna ha.

Oge ụfọdụ, ha adịghị akuziri ụmụ akwụkwọ ihe, sị ha la gaa dee ihe ahụ. Ọ bụrụ onye nne na nna ya amaghị akwụkwọ, nwata ahụ eburu na-akpagharị. Nwa akwụkwọ nwee nsogbu, biakwute ya ọ gaghị ama otu ọ ga-esi gboo nsogbu ahụ.

Ndị nkuzi ụfọdụ na-akuzi maka ego bụ n’ihi na ha-enweghị ọlụ ọzọ ha hụrụ, ụfọdụ n’ime ha bụ maka na ha nwere onye ọnụ na-eru n’okwu na ngalaba na-ahụ maka iwe ndị nkuzi.N’ihi na ha enweghị mmasị n’ọlụ nkuzi na mbụ, ha na-alụ ya otu o si masi ha.

Ndị dị otu a adịghị echeta na ụmụakwụkwọ achinyere ha agaghị eru ogo ibe ha ndị a na- akuziri ihe mgbe nile ruru. Ọzọ, ha adighị echeta na ọganiru nwa ahụ dị n’aka ha.

Ụfọdụ na-eji n’ihi na ha gụrụ akwụkwọ ma nwee ndị ọnụ na-eru n’okwu,na-eme mpụ n’ihi na ọ dịghị ihe ọ bụla a ga-eme ha. Ụfọdụ n’ihi abụbọ ọlụ na-adịkarị n’ala anyị, ha nwere ebe ha na-azụ ahịa.

Ọ bụkwa ebe ahụ ka uche ha na adịkarị. Oge ụfọdụ, ọgwa ụmụ akwụkwọ n’oge na ya jere akwụkwọ, na ya maara ihe, chezọọ na ọ bụ onye nkuzi dị ume ala nakwa nke nwere mmasị n’ọlụ ya kuziri ya o jiri mara ihe.

Ebe ndị nkuzi maka ego a jupụtara bụ n’ụlọakwụkwọ nke ndị gọọmentị. N’ihi na aha ha abaala n’akwụkwọ gọọmentị ji akwu ụgwọ ọnwa, ha eburuzie n’uche na o enweghị onye ga- achụ ha.

N’ezie, ndị nkuzi gọọmentị nwere ndị nkuzi gụrụ akwụkwọ karia ndị nkuzi n’ụlọakwụkwọ otu onye nwere.

Ma na-agbanyeghị na ndị nkuzi n’ụlọakwụkwọ otu onye agụchabeghị akwụkwọ, ha na agba mbọ ịhụ na ụmụakwụkwọ ha na-akuziri na-eme nke ọma n’akwụkwọ ha nile. Ụfọdụ ndị nkuzi nke gọọmentị ,n’ agbanyeghị na ha nwere ezigbo asambodo, enweghị ezi mụọ ikuziri ụmụakwụkwọ ha ihe nke ọma. Nke a bụ n’ihi na ọ bụ ego ka ha chọrọ; ọ bụghị ọlụ.

Ndị ọlụ maka ego jupụtara na ọlụ nile, ha dị na ọlụ oyibo, ọlụ uwe ojii, ọlụ aka, ọlụ ụka; ebumnobi ha bụ ka ha gbaa ụgbọala, yie akwa dị mma, lụọ ezigbo ụlọ.

Onye nkuzi mbụ onye ọlụ anyị jụrụ ajụjụ maka okwu a, aha ya bụ Lolo Louisa Ezeamama kwuru na ya ebughi n’obi ị bụ onye nkuzi. “Ihe m jiri baa ọlụ nkuzi bụ nke a; abaram HRC Enugu ị gụ akwụkwọ. Mgbe anyị gụsiri afọ atọ, n’ihi na anyị bụ ndị izizi, anyi lelesia ule, ha asi na ọ bụ nani mmadụ anọ gafere na klasi nke anọ na ndị ọzọ nile ga agụgharị nke atọ.

Ọtụtụ n’ime anyị wee jụ. M wee baa ụlọ akwụkwọ ọzọ n’ihi na m chọrọ ị ga n’iru na agụm akwụkwọ m, m wee baa ‘Lorreto Teacher’s College’, Adazi. I baa n’ebe ahụ, ị bụrụgo onye nkuzi. Ọ bụ nke a mere m jiri bụrụ onye nkuzi, enwekwara m mmasi n’ọlụ nkuzi nke ukwuu.

N’oge ahụ, ị gụsịa pụta, ezigagị ebe ị ga akuzi ozigbo. Ezigaram Convent School, Ichida. Akuziri m afọ abụọ ebe ahụ.A gakwara m Regina Caeli Obongulu, Imo Steeti ,ebe ahu ka m nwetara G2 m. N’oge ahụ, anyị adịghị akụzi n’ihi ego.

Onye nke abụọ aha ya bụ Elizebath Chinyere Nkwo,n’ịsịsa ya maka ọlụ nkuzi maka ihunanya na ọlụ nkuzi maka ego sịrị na ezigbo onye nkuzi bụ onye ga-ezi nwata ihe okwesiri ịma. Ọ ga-bụkwa onye nwere ịhụnanya ga-eme na onye ọ na-kuziri ga-enwe ike ị na-abiakwute ya. Onye nkuzi enweghi ihunanya, ụmụaka ọ na-akuziri agaghị abia ya nso.

Ezigbo onye nkuzi ga-enwe obi umeala ka ụmụakwụkwọ ya wee na aghọta ihe ọ na-akuzi. Ọ bụrụ na ụmụakwụkwọ adịghị atụ akwụkwọ egwu, na ya na ha dị mma, ha ga na-abiakwute ya na-ajụ ya ihe ha aghọtaghị. Ọbụrụgodu na ọ na-ada ihe ahụ, ọ ga-enwe ike ịbịa ju ajụjụ ka o wee ghọta ya nke ọma. Mgbe m gusiri koleji, ọ gụrụm agụụ ịbụ onye nkuzi maka na ndị kuziri m bụ ezigbo ndị nkuzi. Ihe m na-amaghị, ha edoo m anya ka m wee mara ya nke ọma.

Udị obi umeala ndị nkuzi m bụ ihe mere m jiri sị na m ga-abụ onye nkuzi, ka m onwe m wee kuziere ndị ọzọ ihe.

Ọ bụ ezie na ejim obim nile kwere ikuzi nkuzi na ọ bụghị n’ihi ego, mana o doro anya na ọ bụ ego ka-eji egbo mkpa ọ bụla.A chọrọ m ego dịka ụgwọ ọlụ mana ọ bụghị ego ka m jiri bido ọlụ nkuzi.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here