Otu’Girl Guides’ Anambra a gbaala afọ iri iteghete na ise

0
567
Otu'Girl Guides'

Izunna Okafor

 

ỤBỌCHỊ Fraidee ọnwa Jun dị na mkpụrụbọchị iri abụọ na iteghete bụ nnọọ nnujkwu ụbọchị n’ebe ndị otu ‘Nigeria Girl Guides Association’ ngalaba Anambra nọ.

 

Ụbọchị ahụ ka a nọrọ n’Awka, isi obodo Anambra Steeti wee mee mmemme iji cheta n’otu a agbaala afọ iri iteghete na ise nke o ji bata steeti Anambra. Kọmishọna Helen Obi gbọrọ ihe ewu na-eri makana ndị mmadụ si n’elu si n’ala bịa ka igurube wee nye ha nkwado maka ọlụ ọma na mbọ ndị otu a na-agba maka ọdị mma ụmụaka ụmụnwanyị.

Ndị otu a jiri ohere a wee gosipụta ihe dị iche iche. Isiokwu ha bụ ‘Voices Against Violence’ nke bụ ikatọ mmegide n’ụzọ dị iche iche mmegbu a na-emegbu ụmụnwanyị si abịa. Ha nọkwa n’emume a wee gosipụta akwụkwọ nke e dere gbasara ọdị mma ụmụaka nwanyị,nke ọ bụ Kọmishọna otu a bụ Helen Obi dere. Ha nyekwara ndị mmadụ nkwanye ugwu ‘Award’ ma werekwa ụbọchị ahụ dịka ụbọchị ndị nne ha ‘Matrons Day’.

Dịka ha kwanyeere ọtụtụ ndị mmadụ ọnụ ruru n’okwu ugwu site n’inye ha ‘award’ ka ha si sopụkwara ọtụtụ ndị okenye ndị nne ma nyekwa ha ugwu ruuru ha.

Ọkammụta J.O Ogbuagu bụ onye nọchitere anya onye isioche kelere ha maka mbọ ha ma gbakwa ha ume. O kelere Chineke maka ọnọdụ ọma ahụ.

‘ Sir’ Anthony Obi bụ di kọmishọna otu a nọnyeere ha ma nyekwa nkwado ya n’ebe ọ dị ukwu.

OliakụHelen Obi kelere mmadụ nile n’ine ọ gụpụtara ma kwuo na ọ bụ n’afọ 1923 ka otu a batara na steeti Anambra. O kwuru na ọ bụ na St Monica Ogbunike bụ ebe mbụ a malitere ya.

O kwukwara na otu a bụ nke nọ kemgbe wee na-akwalịte ụmụaka ụmụnwanyị, na ha chọrọ ka tigbuo na zọgbuo pụọ kpam kpam n’ụwa. O kelere mmadụ nile maka ịbịa kwado ha.

Otu dibịa oyibo nke si ‘Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University Teaching Hospital, Awka’ wee bịa, nke aha ya bụ Dọkịnta Ufaro Chinyere Uche, kụziiri ndị mmadụ ihe maka ahụ ike. Ọ dụrụ ọdụ ka mmadụ na-eleba anya na ndụ ya site n’ịga ụlọgwụ maka nnyocha kwa mgbe kwa mgbe.

O kwuru ka ndị mmadụ na-eme mmegharị ahụ ‘exercise’, na-añụchite mmiri anya ma na-eri nri na-azụ ahụ. Njideka Okoye, onye si INEC wee bịa nyere nkụzi maka akwụkwọ nke bụ ikike e ji atụ votu ‘Voters Registration Card’. O kọwara na nke a bara uru ma dịkwa nnukwu mkpa.

Ọtụtụ ndị mmadụ si obi gọọmentị Anambra Steeti wee bịa. Aka na-achị Anambra steeti bụ onye nke so na ndị e nyere ‘award’ zitere mmadụ ka ọ nọchite anya ya.

E nyekwara ọtụtụ ndị kọmishọna na ndị isi ngalaba dị iche iche ‘awad’. Ha gunyere Mazị Chuka Nnabuife, onye isi ụlọ ọlụ, ‘National Light Newspapers’, Awka; ‘Sir’ Uche Nworah, ‘MD, Anambra Broadcasting Service’; Mazị Gab Muoneke, onye isi oche ‘Nigeria Bar Association,’ ngalaba Awka; Chukwuemeka Orjiakor (Onwa); Dr Neme Iruakasi, Lady Ngozi Agbasimelo, Oriaku Comfort Udem, Glad Ezenwa na ọtụtụ ndị ọzọ.

Sir Chuka Nnabuife, otu onye n’ime ndị e nyere nkwanye ugwu kelere ha ma kwuo na ya so n’otu ‘Boys Scout’ ruo ma taa. O toro ha maka mbọ ha ma nyekwa ha ezigbo nkwado.

‘Sir’ Anthony Obi, gosipụtara afọ ojuju ya n’ebe ndị otu a nọ site n’ịgba mbọ ka tigbuo na zọgbuo laa n’ala anyị.

N’ikpeazụ, e ji añụli zuru oke wee mechie mmemme a, ebe kọmishọna ha bụ Helen Obi jikwa ụbọchị ahụ cheta na o tinyekwala otu afọ na ndụ ya ‘birthday’.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here