Ụmụafọ Nigeria enyela Obianọ onyinye nkwanye ugwu n’Austria

0
768
Ụmụafọ Nigeria enyela Obianọ onyinye nkwanye ugwu n'Austria
Ụmụafọ Nigeria enyela Obianọ onyinye nkwanye ugwu n'Austria

Izunna Okafor dere akụkọ a

 

DỊKA a sị na dike na ebube ya so aga, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ abụrụla onye e nyere nnukwu nkwanye ugwu pụrụ ichè site n’aka ụmụafọ ala Nigeria bi na Vienna nke mba Austria nakwa site n’aka ụmụafọr Anambra niile bi na mba Austria ahụ.

Onyinye nkwanye ugwu abụọ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ọgbakọ ịtụ ndụ mmanụ nke a chịkọbara site n’aka otu jikọtara ndị azụmahịa, nke mba Austria na Nigeria, bụ ndị a maara n’asụsụ bekee dịka “Nigeria-Austria Chamber of Commerce”, ma bụrụkwa nke e mere na Hilton Am Stadtpark, Vienna, nke mba ahụ.

Ka ha na-enye ya onyinye nkwanye ugwù abụọ ahụ, ndị otu ahụ toro Gọvanọ Obianọ maka ọrụ ọma dị iche iche a hụrụ anya ọ rụpụtagoro n’ọchịchị ya, bụkwa nke ha kwuru na o weghachila nnọọ ntụkwasị obi ndị mmadụ nwere n’ezi ọchịchị n’ala Nigeria.

Na nzaghachi, Gọvanọ Obianọ, onye obi jupụtara n’ọñụ toro ndị otu ahụ maka ịhụta ya dịka onye tozuru oke ịnata nkwanye ugwu ahụ, ma kwuo na ọ na-arànyere ụmụafọ steeti Anambra niile onyinye nkwanye ugwú ahụ, ma ndị nọ n’ụlọ ma ndị nọ na mba ofesi, bụkwa ndị na-agbasi mbọ ike n’ihe ha na-eme. O tokwara ndị otu ahụ banyere otu ha si jikọlọta onwe ha ọnụ nakwa otu ha si achịkọba ọgbakọ nkuzi na ọgbakọ ihe ọmụmụ dị iche iche na mgbe na mgbe, bụ nke ya onwe ya sogoro bịa nye nkuzi na ya otu oge gara aga.

Ndị sonyeere Gọvanọ Obianọ wee gaa ya bụ ọgbakọ gụnyere ụfọdụ ndị isi ọchịchị steeti ahụ, ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra etiti n’ụlọ omebe iwu sineeti ala anyị bụ Maazị Victor Umeh, tinyere onyeisi otu ndọrọ ndọrọ APGA n’ala anyị, bụ Maazị Victor Oye.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here