A kpọọla oku ka e nwee ezi nchekwa na ala Igbo

0
563
Ala Igbo

Izunna Okafor

 

N’IHI nsogbu ajọ ọnọdụ nchekwa ahụ dị n’ebe dị iche iche n’ala Nigeria ugbu a, ndị e ji okwu ha agba izù na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ akpọọla okù ka e nwee ezi nchekwa bụ ịgbà na mpaghara ahụ nakwa mpaghara ebe ndị ọzọ dị iche iche n’ala anyị.

Ọkpụkpọ oku a bụ nke pụtara ihè na nnukwu ọgbakọ a chịkọbara site n’aka onyeisi ndị uwe ojii n’ala anyị, bụ Maazị Ibrahim Idris, bụ nke o bu aga na mpaghara ebe dị iche iche n’ala anyị iji nye ndị mmadụ nkuzi pụrụ iche banyere nchekwa bụ ịgbà, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n’Owerri bụ isi obodo steeti Imo, dịka ọ bụ oge ndi mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ.

N’ozi mmalite ya n’ọgbakọ ahụ nke isi okwu ya bụ “nchekwa ime ime obodo: icheghachi echiche banyere nchekwa ala anyị iji kwalite ọnọdụ mmepe” Maazị Idris kwuru na isi sekpụ ntị na mmemme ajụ bụ iji tụpụta usoro nchekwa bụ ịgbà maka nchekwa obodo iji belata nsogbu ajọ ọnọdụ nchekwa dị n’ala anyị ugbu a. Ọ kpọkuzịkwara ndị e ji okwu ha agba izù na mpaghara ahụ ka ha jikọọ aka ọnụ n’ezi mbọ ahụ a na-agba ime ka nchekwa obodo guzosie ike.

N’okwu ya, onye a nọ na steeti ya achịkọba ọgbakọ ahụ, bụ Gọvanọ Rochas Okorọcha mere ka a mara na ụfọdụ ihe kacha akwàlite ajọ ọnọdụ nchekwa n’ala anyị bụ enweghị ezi usoro nzikọrịta ozi, na otu ndị ndu si ara ntị mmanụ banyere ajọ ọnọdụ ndị ha na-achị achị na-agabiga, ma too ndị hibere ọgbakọ ahụ n’ihi ezi atụmatụ dị otu ahụ.

GUO:  ‘A ga-amàchi ịhụta mmadụ dịka òsú n’ala Igbo n'afọ a’

Na ntụnye nke ya, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ onyeisi otu nnyocha ndị ọrụ nchekwa ime ime obodo na steeti Anambra ma bụrụkwa onyeisi ndị uwe ojii n’oge gara aga, bụ Maazị Ikechukwu Aduba kwuru na ọnọdụ nchekwa n’ala Nigeria ugbu a bụzị nke na-agba anya mmiri, ma kpọkwazie òkù ka e nwee ezi njikọ aka ọnụ n’etiti ndị ọrụ nchekwa na ndị obodo iji wee mee ka nrọ ahụ na atụtmatụ dị iche iche a ga-atụpụta n’ọgbakọ ahụ bụrụ nrọ pụtara ihè.

Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere onyeisi Ọhanaeze Ndị Igbo n’ala anyị, bụ Maazị Nnịa Nwodo, na onye ọbịa nyere nkuzi ebe ahụ, bụ Ọkammụta Mohammad Ụmar na ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na mpaghara ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here