Abụ maka Naịjirịa

0
636
Awuufu, Abụ maka Naịjirịa

Oge Afrịka

 

Pita Ejiọfọ dere nke a

 

IHE a kpọrụ “Oge Afrịka”
Dị eziokwu, n’AlaIgbo,
Mgbe ọbụla e nwere ọgbakọ,
O kpuru okpueze, were oche.

A ga-ama ọkwa, dọọ aka na ntị,
Na oge Afrịka adịkwaghị na nke a,
Na nzukọ ga-ebidokwa ka e kwuru,
N’elekere iri kpọmkwem.

Mọọbụ na “tualfụ”na-akụ akụ,
Ka onye ọbụla wee laa ngwa.
Ma mgbe ahụ ruo, kama mmadụ,
Oge Afrịka ewere ọnọdụ.

Mkpụrụ mmadụ atọ “amaghị ihe”,
Abịa ka e kwuru, nọrụ na-eche,
Ndịọzọ anọrụ n’ụlọ na-ajụ,
“Abịawala ha?”, na-eme ihe ha na-eme.

Ọ gachaa awa abụọ oge a kara,
Ogene Oge Afrịka akụọ,
Ndị nzukọ ekulie, jiri nkpọ,
Kuru akụpe, jụrụ ọha,na-abịa.

Mgbe ọgbakọ mechaara bido,
E bidorịị gbuwe nke bụ oge,
Ịkpọgota ndị tebulu n’oche,
Erikwa otu awa nke ya.

Nnukwu mmadụ ọbụla bịa,
Nzukọ akwụsị, e bido tuwe ya aha,
O kelewe onye ọbụla n’otu n’otu,
Oge Afrịka ana-aga.

Mgbe ọgbakọ ga-anọzị n’uju,
Mgbanụ, mgbanụ eweghara.
Ọ bụrụ n’oriri, a bụọ nri na mmanya,
Kọọ ọnụ so ya, kụrụ mgbanụ laa.

Mgbe mbụ e chere, na ọ bụ,
Akụwaghị sleeti mere ya,
Ma taa, asambo na-abawanye,
Oge Afrịka ana-etowanye.

N’ọgbakọ ndị ‘maara ihe’,
Ihe na-ebenụ ana-ebekwa.
E yichaa suutu, sụchaa bekee,
Oge Afrịka a na-achị

Mgbe o jiri masị onye,
Ọ na-abịara onwe ya nzukọ,
Arụ wee gbazịa afọ,
Wee bụrụ omenaala anyị.

Mgbe ụfọdụ puku mmadụ ekposara,
Onyeisi ka a na-eche awa atọ na anọ,
Teenu ka e kwuru ọ ga-abịa,
Ma n’awa ise na mgbede ka ọ bịazịrị.

Ma ndịọcha kwuo ‘teenu’,
Naanị ‘teenu’ ka ọ ga-abụ,
Ma anyịnwa kwuo ‘teenu’,
Ebido na ‘tualfụ’, kelee Chukwu.

GUO:  Abụ maka Naịjirịa

Awa olenụ ka anyị na-atụfu,
Kwa ụbọchị n’oge Afrịka?
O nwekwaghị ndị gara n’ihu,
Ọ bụghị elekere bụ eze ha.

Oge Afrịka na mmepe Alaigbo,
Otu Afọ ga-azụkwanụ.
Anyị chọọ ịga n’ihu ka ndị ọzọ,
Oge Afrịka ga-akwụsịkwa.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here