Alụ: Ndị nkuzi na-akwasazị ụmụakwụkwọ ha iko

0
557
Alu

Chinwendu Uzoatu

 

EGWU dịkwa! Ihe arụ na-emezi. Ọkwa ndị Igbo na-ekwu n’okwu sị na alụ gbaa afọ, ọ bụrụ omenala. Gini kpatara na nkịta na-atazi ọkpụkpụ a nyabara n’olu aghara aghara n’ụlọakwụkwọ anyị? Ma n’ụlọakwụkwọ nta ma nke ukwu, otu ihe ahụ na-ebe.

Ndị nkuzi bụ ndị a hanyere ụmụakwụkwọ n’aka ka ha kụzie ma gbazikwaara ha. Mana ọ na-abụzi ihe iju anya ebe onye nkuzi n’atụgharịzị ghọrọ nwamba, chụba ụmụakwụkwọ ka oke.

A kọọna ọtụtụ akụkọ banyere alụ dị iche iche na-eme n’ụlọakwụkwọ ugbua. N’izu ụka olemole gara aga ka a kọrọ ka ndị nkuzi mmadụ ise si tụba otu nwata akwụkwọ nke nọ na ‘senior’ sekọndịrị ogo nke atọ ime na steeti Kebbi.
N’otu aka ahụkwa, na nwa mgbe gara aga ka a gbara n’anwụ otu e si chụọ otu ọkammụta n’ọlụ na mahadum ‘Obafemi Awolowo, Ile Ife, n’ihi nwanyị onye ọchọrọ idina ka o wee nye ya maaki n’ule akwụkwọ ha lere.

N’oge gara aga, a kọrọ ka otu onye na-efe ala nna ya si dinaa nwata akwụkwọ na klaasi mgbe akwụkwọ gbasara. Nke a mere na steeti Anambra. Ka a na-ekwu maka ụmụnwoke, ka a na-ekwukwa maka ụmụnwanyị. Kedu maka ndị nkuzi ụmụnwanyị ndị ụmụakwụkwọ ha ndị nwoke na edina?

Ọzọkwa bụ ụfọdụ ndị nkuzi nwanyị na-edina ụmụakwụkwọ nwanyị ibe ha ebe ndị nkuzi nwoke na-edina ụmụakwụkwọ nwoke. Nke a jọgburu udene na njọ ma sigbuo nkakwụ n’isi.

Ọ bụ gini ka ndị nkuzi dị otu a ga-akọrọ chi ha? Aga akpọ ha ndị nkuzi ka ọ bụ ndị nkụgọ?

Ka o sila dị, a gbara ndị mmadụ ajụjụ ọnụ, ebe ha nọrọ kọwaa ọtụtụ ụzọ ha sirila hụ ụdị alụ dị iche iche ndị a. Otu nwata akụkwọ nọ n’afọ nke ikpeazụ na mahadum ‘Nnamdi Azikiwe n’ Awka (Unizik)’ onye nke achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na nke mere na mahadum OAU Ife dị obere na nke na-eme na n’ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ.

GUO:  Alụ: Obodo agbaala ụlọ ụka jikọrọ ụmụnne di na nwunye ọkụ

O kwuru hoo haa na e nwere otu onye nkuzi na-akwatuzi ụmụakwụkwọ n’ule n’ike n’ike n’ihi na n’otu oge, nwata akwụkwọ nwanyị kpere ya n’aka ndị nlekọta n’ihi alụ ọ na-eme. Nwoke a ka o kwuru na ọ na-agwa ụmụakwụkwọ a ka ha kwụọ ụgwọ n’ụlọ oriri na ọñụñụ, gbakwaara ya ụgbọala ka o wee bịa dinaa ha wee bufee ha n’ule.

Ọ bụzi n’ihi na nwata akwụkwọ a kpesaara ndị isi ha ihe ọ na-eme ka o jizi na-akwaada ụmụakwụkwọ n’ule ebe ndị ọkpa ogologo ji ahụ ha agbara onwe ha makana onye kwere n’ihe Onitsha kwuru, ọ laa n’oge.
Onye nkuzi na-akpa ụdị agwa dị otu a bụ ezigbo onye iberibe n’ihi na nkịta rachara ya anya. Ma ya chetakwa na ụgwọ ọlụ ya na-eche ya.

Otu onye nkuzi nke nọ n’Okpuno, Awka South, nke nọ n’ogo sekondiri bụ Elizabeth Ilonwa kọwara na dịka ndị nkuzi nwoke na-enye ụmụakwụkwọ nwanyị nsogbu na o nwekara ọtụtụ ụmụakwụkwọ nwanyị ji aka ha agakwuru ndị nkuzi nwoke ka ha wee gafere n’ule.

O kwuru na ọtụtụ ụmụakwụkwọ na-eji aka ha etinye onwe ha n’ọnwụnwa. Site na nke a, anyị ga-achọpụta na ọ bụ ụmụakwụkwọ achọghị ịgụ akwụkwọ nke ha ji achọ ịbara onwe ha uru na-akpa udi agwa a. Nke a meziri na amaghịzị otu e si akwọ onye ukwu wara.

Ọ bụ gini ka a ga emezi? Mmiri esila n’isi wee gbarụọ. O kwesiri ka gọọmentị lebara ihe a anya, maka ọ bụrụ na amaghị ihe e mere ya, nke a ga-emebi ihe, ma ugbu a ma na ọ dị n’ihu. O kwesiri ka a taa onye nkuzi ọ bụna e nwetere n’ụdị ọnọdụ a ezigbo ahụhụ ka ndị ọzọ wee mụrụ akọ.

GUO:  Alụ: Obodo agbaala ụlọ ụka jikọrọ ụmụnne di na nwunye ọkụ

Ọ bụ n’ihi nke a ka Chigozie Anueyiagu nke ‘National Light Newspapers’ ji kwuo na o kwesiri ka ndị uwe oji nwụchikọọ onye nkuzi ọ bụna kpara ụdị agwa a, chụọ ya n’ọlụ, kpụpụkwa ya ụlọ ikpe ma tụọ ya nga. Ọ gakwara n’ihu kwuo na a ga-anapụ ya akwụkwọ ikike o ji bụrụ onye nkuzi n’ụlọakwụkwọ ọ bụna na ndụ ya.

Otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ihe e kwesiri ime ụdị onye nkuzi a bụ imebi ihe o jiri bụrụ nwoke nke bụ na ọ hụ nwanyị, ọ gaghị elekwa ya anya ọzọ na ndụ ya.

Otu osila dị, ihe dị njọ dị njọ. Nkuzi bụ ọlụ e ji ama atụ. Okwesighi ka ugwu ndị nkuzi kpụọ n’ala. Onye nkuzi ọ bụna were ire ya gụọ eze ya ọnụ n’ihi na nkịta anaghị ata ọkpụkpụ a nyabara ya n’olu.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here