Anyị enweghị ala maka agbụgbọ ehi – Ndị gọvanọ ala Igbo

0
692

Izunna Okafor dere akụkọ ndị a

 

OTU ahụ jikọtara ndị gọvanọ steeti ise dị na ndịda ọwụwa anyanwụ ekwuola na ha agaghị enye ma ọ bụ wepụta ọbụnadị mpempe ala ọbụla na mpaghara ahụ maka ịrụ agbụgbọ ebe a na-azụ ehi.

Ndị otu a mere ka a mara nke a n’okwu ha gwàrà ndị nta akụkọ ka ha mechara ọgbakọ pụrụ iche ha nwere ụbọchị ụka gara aga, bụ nke weere ọnọdụ n’obi gọọmenti steeti Enugu, ma bụrụkwa nke ha nọ na ya wee nwee ọtụtụ nkwekọrịta maka ọdịmma ndị mpaghara ahụ na ihe iche aka mgba dị iche iche na-echere ha.

N’ajụjụ ọnụ ahụ a gbara ya, onyeisi ndị otu ahụ ma bụrụkwa aka na-achị steeti Ebonyi, bụ Gọvanọ Dave Ụmahi, mere ka a mara na dịka ka ha siri kpebie, na o nweghị akụkụ ala ọbụla na mpaghara ahụ a ga-ewepụta maka ịrụ agbụgbọ ehi, dịka gọọmenti etiti siri nye ntuzi aka. O kwuru hoohaa na ndị mpaghara ahụ enweghịdị ala nke zuuru ha wee fọdụzie nke a ga-enye ndị Fụlani ka ha were rụọ ebe a na-azụ ehi.

O mere ka a mara na ndị ọchịchị steeti dị iche iche na mpaghara ahụ emefuola ọtụtụ ego n’ikpezi esemokwu na-adapụta n’etiti ndị Fụlani na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo na mpaghara ahụ, ma kwuo na ha ga-enwe nzùkọ oge adịghị anya, ha na ndị isi ọrụ nchekwa n’ala anyị, ndị ọrụ ugbo na ndị Fụlani na-achị ehi, iji wee bèlata otu ndị Fụlani si epiogharị ma na-awagwòsi ebe dị iche iche na steeti dịgasị na mpaghara ala Igbo n’ihi nsogbu nke ahụ na-eweta.

Gọvanọ Ụmahị kwukwara na ha nọkwara na mmemme ahụ wee nata atụmatụ na ụkpụrụ pụrụ iche nke onyeisi Ọhanaeze Ndị Igbo n’ala anyị, bụ Maazị Nnịa Nwodo wetaara ha banyere ịhazigharị ọnọdụ ala anyị, dịka o siri dị na nkwekọrịta ahụ ha mere na nnukwu ọgbakọ ndị Igbo ahụ weere ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka, bụkwazị nke o kwuru na ha nyere gọvanọ dị iche iche na mpaghara ahụ ka ha ga lebàá ya anya nke ọma ma kwuputa mkpebi ha banyere ya n’ọgbakọ ọzọ ha ga-eme.

Dịka o siri kwuo, ihe ndị ọzọ ndị otu ahụ lebàrà anya ụbọchị ahụ gụnyere ahọ ole onyeisi otu jikọtara ndị eze ọdịnala na mpaghara ahụ ga na-anọ n’ọkwa, bụ nke ha kwekọrịtara ka ọ bụrụ ahọ abụọ ma kpọkuokwa onye ji ya bụ ọkwa ugbu a, bụ Igwe Eze Eberechi Dick ka o nyefee ya n’aka onye Anambra n’okpuru Igwe Nnaemeka Achebe nke Ọnịtsha malite n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọgọsụtụ ahọ a.

Ha ji ohere ahụ lebakwa anya n’obere nghọtahi ahụ dapụtara n’etiti steeti Anambra na steeti Ebonyi banyere okporo ụzọ Abakaliki ahụ dị n’Awka, bụkwa nke ha kwuru na ọ bụghị ihe rijuru afọ.
Ha nọkwazịrị n’ọgbakọ ahụ wee kasie gọvanọ steeti Plateau obì banyere ihe anyammiri ahụ dakwasịrị steeti ahụ nso nso a.

Ọgbakọ ahụ dọtara ndị gọvanọ steeti ise mejupụtara Ndịda-Ọwụwa anyanwụ ala anyị, beere sọ gọvanọ steeti Imo, bụ onye eziteghị onye nnọchi anya ọbụla ma ya fọdụzie ịbịa n’onwe ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here