E liena ozu ndị fada abụọ na Dayọsis Awka

0
825

Chinwendu Uzoatu

 

ỌNWỤ bụ ozuru ụwa ọnụ. Ọ maghị onye ukwu nke ọ na-ama onye nta. Ọ bata n’obodo, ebe nile e dere duu. Ọ bụ nke a mere na Monde gara aga, ọnwa Julai dị na mkpụrụbọchị iteghete, ite esighi n’Aguata nke ọ na-esi n’ụlọụka ‘St Patrick’s Cathedral, Awka’.

Ọ bụ ụbọchị ahụ ka e liri ndị ụkọchukwu abụọ n’ogige ebe a na-eli ndị fada n’obi Chukwu ahụ.
‘ Rev Fr’ Christopher Chukwudiebere Azolibe bụ onye Isuofia, ọ nwuru ka ọnwa Jun dị na mkpụrụbọchị iri, ebe Rev Fr Hycinth Belonwu Okonkwo bụ onye Aguluezechukwu, ọ nwụrụ ka ọnwa Jun dị na mkpụrụbọchị iri abụọ na abụọ. Ha abụọ bụcha ndị okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra.

Olili ozu a, nke weere ọnọdụ n’obi Chukwu ‘St Patrick’s Cathedral Awka’ kpokulọtara ọtụtụ ndị mmadụ, ndị obodo jiri biri. Aka na-achị Anambra Steeti bụ Chief Willie Obiano zitere onye kọmishọna na-ahụ maka agụm akwụkwọ bụ Ọkammụta Kate Omenụgha ka ọ nọchite anya ya. Ndị ọzọ bịaranụ gụnyere Chief Victor Ume, ‘Senator Anambra Central’; Dr Joe Akabuike, bụ Kọmishọna na-ahụ maka ahụ ike; Ikem Uzooezie bụ onye na-anọchite ọgbọ nta ‘vote’ Aguata 1 n’ụlọ nzụkọ omebe iwu nke steeti Anambra; Prof Fidelis Okafor, onye jibu ọkwa dịka onye isi ụlọakwụkwọ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu ‘University’ na ndị ọzọ.

Bishop ụka katọlik Awka Dayọsis bụ ‘Most Rev Dr’ Paulinus Ezeokafor, bụ onye nọrọ n’isi aja maasi ma bụrụkwa onye ụmụ ya nwụrụ kelere Chineke maka ezigbo ndụ nke ndị ụkọchukwu abụọ ahụ. O kpere ekpere ka Chineke nabata ha n’ihi na ha jiri ndụ ha chụorọ ya aja. Ọ kasikwara ezinaụlọ ha na ndị ụka obi ma kọwakwaa ọnwụ dịka njem okwukwe.

N’okwuchukwu, Rev Fr. Benard Anaebuna tokwara ndị ụkọchukwu abụọ a lara mmụọ maka ọlụ ọma ha ma dụkwaa ndị ụka ọdụ ka ha na-akwado mgbe nile maka ọnwụ site n’ịgbaghara mmehie ọsọ ya na imezi ihe ndị ha mebiri emebi.

Otu ụkọchukwu onye Aguata, Rev Fr. Alphonsus Ezeoke, onye bụ ụkọchukwu na ‘Our Lady of Assumption’ Nimo, n’okwu nke ya, tokwara ndị ụkọchukwu ahụ ma rịọ Chineke ka ọ nabata ha.

Fada ọzọ sikwa Aguata ma bụrụ ụkọchukwu ‘parish’ nke ‘St Anthony’s, Ekwulobia, Rev Fr Longinus Egbuonu, kwuru na ọnwụ ha bụ uche Chineke ma kpọkuo ndị mmadụ ka ha na-achọ udo mgbe nile.

Rev Fr Hycinth Okonkwo lara mmụọ bụ onye nke e chiri fada n’afọ 1975 ma nọgide n’ọlụ ya ruo n’ọnwụ. A ga-emere ya emume ncheta otu ọnwa ‘months mind’ n’obodo ya na nso nso a. A ga-eji aja maasi wee malite nke a na ‘St Peter’s Catholic Church’, Aguluezechukwu.

Ebe e chiri ‘Rev Fr’ Christopher Azoline fada n’afọ 1998. Ruo n’ọnwụ ya, ọ bụ ụkọchukwu parish ‘Our Lady of Fatima’, Igboukwu’. A ga emekwara ya ncheta otu ọnwa na be nna ya nke a ga-eji aja maasi malite na ‘SS Peter and Paul Parish’, Isuofia.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here