Ịgbochị mkpamkpa ide mmiri n’ala anyị

0
713
ide mmiri

Uchenwa Mba

 

MMIRI ozuzo dị mma maka na ọ bụ oge mmiri ozuzo ka eji akọnye ihe a ga-eri kwa afọ ọ bụla. Ọ bụkwa oge ihe nile dị ndụ ji ekute ume ndụ. Mmiri ozuzo dị mma mana oke mmiri ozuzo na-ewetara ihe ọ bụla na-eku ume oke ọdachi.

Ọ bụ n’ime oke mmiri ozuzo ka e si enweta oke ide mmiri bụ nke na-ewetara ihe nile ọ bụla oke ọdachị jọgbụrụ onwe ya. Ide mmiri pụtara mmiri juputara ebe nile na mberede, oge ụfọdụ ọ bụrụ n’oge ehihie ma ọ bụ oge abanị.
Ide mmiri bụ ihe enweghị aka ma ọ bụ ụkwụ mana ọ na-akpa ike ọjọọ. Ọ na-eropụ osisi n’agbanye ka osisi ahụ ra, ọ na-akwatu ụlọ, ọ na-ebu mmadụ, na-ebukwa ụgbọala nakwa ọtụtụ mmekpa ahụ ọ na-ewetara mmadụ. N’izu ụka gara aga, anyị nụrụ ka ide mmiri siri buru ụgbọala na ndị no n’ime ya. Ndị nọ n’ime ụgbọala ahụ bụkwa ozu ha ka a hụrụ n’ikpeazụ.

Ọ dịkwa mgbe ụlọ ọlụ nta akụkọ ‘Sun’ buru akụkọ maka otu nwaamadi bi na Lagos ide mmiri wakporo ụlọ ya ma gbagbuo ụmụ ya atọ na ihe ndị ọzọ o mebiri. N’afọ gara aga, ide mmiri buuru otu nwata e dunyere ozi ka mmiri na-ezo. N’ọtụtụ afọ gara aga, ọ dị otu nwanyị a mụrụ n’Ifite Awka mana ọ na-alụ di na ime Awka. Nwanyị ahụ mụrụ ejima. Nwanyị ahụ gara ugbo mmiri bido, mgbe o ji rute UNIZIK, ide mmiri ejula ebe nile ma buru nwanyị ahụ.

E wepu ụlọ, osisi, ngwa ahịa nakwa ngwo ngwo ndị mmadụ ide mmiri nwere ike I buru. Ihe ọzọ na-eweta ide mmiri jiri ebukarị mmadụ bụ enweghị ndidi. Mmiri na-ezo, ụfọdụ asị ka ha laba, ma ọ bụ ha ebilie, gaba ọlụ ma ọ bụ ahịa ma ọ bụkwa ebe ọ bụla dị ha mkpa. Oge ụfọdụ, ha ekwudo oke ide mmiri n’ụzọ. N’ihi na ha amaghị otu ụzọ ahụ dị na mbụ, tinyere ide mmiri juru ebe nile, ha adanye n’olulu, ide eburu ha.

GUO:  E butela ozu mmadụ abụọ idè mmiri gbàgbùrù n'obosi

Ihe ọ bụla nwere ọghọm nwekwara uru. Uru abụghị n’anyị na-asi ka ide mmiri na-adi mgbe ọ bụla. Ụfọdụ uru dị n’ide mmiri bụ na akụkụ ndị ọlụ ubi ka ọ dịkarị maka na ebe ọ bụla ide mmiri na ebukọ ihe nile, ịkọ ihe n’ebe ala ubi dị otu ahụ na-eme ihe nke ọma.

Uru ọzọ bụ na mmiri ide kwopụtahie nne, o bupụta ọtụtụ ihe bi na mmiri dịka azụ na anụ ndị ọzọ, ndị mmadụ eje buru ha. Oge dịka afọ 2012, mgbe ide mmiri wakporo ụfọdụ mkpaghara n’Anambra, ide mmiri bupụtara ọtụtụ anụ bi na mmiri, ndị nwere obi na-agakwa egbu ha.

Nke a bụ ntunye okwu na ndumọdu otu onye ụkọchukwu aha bụ Rev. Daniel Egeonu tinyere maka mkpamkpa ide mmiri na-akpa. “Ide mmiri na-ebupu ihe a kụrụ n’ubi dịka ji, akpụ, akwụkwọ nri nakwa ihe ndị ọzọ. Ide mmiri na-emebi okporo ụzọ, ọ na-akwatu igwe ọkụ eletiriki, ọ na akwatu ụlọ ebe obibi ma na-akwatu mgbidi eji agbachi okirikiri (fence). Ide mmiri na-asachapụ ala mmadụ ma na-ebukwa mmadụ. Ụfọdụ adịghị echeta na ide adịghị akpa oke ebe ọ ga ejedebe.”

Mgbe a jụrụ ya ka a ga-esi gbochie ọghọm dị n’oke ide mmiri,o kwuru na nke mbụ bụ mmiri bido, onye ọ bụla nọrọ ebe ọ nọ ka mmiri gbachasịa. Otu ụzọ ọzọ a ga-esi gbochie oghom a bụ ka ndị mmadụ ghara ikponyezị ahịhịa n’ọwara mmiri si aga,ka onye ọ bụla mara na onweghị ihe karịrị ndụ.

O kwesiri ka ndị gọọmentị leba anya n’ihe gbasara ide mmiri.Ka ha lụọ ezigbo ọwara mmiri ka ide na-aga ebe okwesiri. Onye na-alụ ụlọ, ya alụchina ebe ide mmiri na-esi aga. Ndị na-ekponye ahịhịa n’ọwara mmiri ma ọ bụ n’ide ma mmiri na-ezo, kwụsi ya kpam kpam.

GUO:  Anambra ewepụtala ebe a ga na-atụkọta ihe maka ndị iju mmiri chụpụrụ be ha

Nke ọzọ bụ na gọọmentị kwesịrị iwepụta ebe a na-ekpofu ahịhịa, ọkachasi n’obodo mepere emepe. Ndị ala anyị na echu obodo oyibo ka mmiri. O kwesịrị ka ụfọdụ n’ime ha kpatara ego nyere gọọmentị aka n’ihazi obodo anyị ka ọ na-atọ ụtọ dị ka ebe ahụ ha jere.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here