Ighafu ọbara: Gọọmentị Nigeria bu iru abụ – Ndị bishọọpụ

0
569
Ndị bishọọpụ

Chinwendu Uzoatu

 

NDỊ ‘Catholic Bishops Conference of Nigeria’ (CBCN) amala Gọọmentị Etiti ikpe gbasara ọnọdụ nsogbu nke ndị ọlụ ugbo na ndị na-achị ehi nke ekweghịkwa mmadụ ñụrụ mmiri togbọ iko ma bụrụkwa nke kpatagoro ọnwụ nari kwuru nari ndị mmadụ na steeti Taraba, Plateau, Nasarawa na Benue.

Ndị bishọpụ a kwenyere na gọọmentị a haziena usoro iwu Nigeria ka ọ chekwaa ndị na-achị ehi ma tinyezie ndị ọlụ ugbo na mwakpo ebeebe.

Ha na-atụ uche na udo na ịdị n’otu nke ala Nigeria ga-ama afọ n’ala ma ọ bụrụ na gọọmentị emeghị ngwa ngwa wepụ aka ngwere n’ofe ma kpee ikpe mkwumọtọ n’ebe onye Nigeria ọbụna nọ n’agbanyeghị agbụrụ na ụka onye na-aga.

Onye isi oche otu a bụ ‘Most Rev’. Augustine Akubeze, n’okwu ya na Monde gara aga kwuru na ndị uweoji na ndị ọlụ nchekwa ndị na-akwado ha so kpata mkpamkpa ahụ kpara na steetị Plateau bụ nke tara isi mmadụ karịrị otu nari.

Ọ katọrọ ịghafu ọbara ahụ kpam kpam ma kpọkuo ndị uweoji ka ha gbakarịa nkịta n’ọsọ ma nwụchikọọ ndị kpara arụ ahụ ma kpupu ha ụlọikpe.

Ọ gara n’ihu kwuo, “ọ na-agbagwoju anyị anya bụ ụdị agwa ihu abụọ nke ndị uweoji na ndị ọlụ nchekwa ndị ọzọ na-akpa mgbe ndị na-achị ehi wakporo ndị mmadụ ma gbukwaa ha.

“N’ihe ndị nke mere ikpeazu, ndị uweoji gbara mbọ ma mee ihe iwu kwuru ma ọ dịghị otu a na ndị mere mbụ. Maka udo na ịdị n’otu nke Nigeria ka o ji kwesi ka ụdị ịgba mbọ a bụrụ nke a ga na-etinye n’ọlụ n’oge nile.

GUO:  Ndị otu Kristi amara ikpe ọnwụ: Bishọọpụ edegarala Buharị akwụkwọ

“Ọ bụrụ na onye isi ala agaghị echekwanwu ndị Nigeria, ịmara na n’otu ihu ahụ na ndị ọ na-achị agaghị enwezi ntụkwasi obi n’ebe ọ nọ.

“Ọ gaghị anogide n’ịchị n’elu ọbasara ala a na-egbu mmadụ ‘killing field’ na ili egwukotara ọnụ maka ọtụtụ mmadụ ‘mass graveyard’ nke Nigeria bụzi.

Ndị bishop ụka Katọlik, kasiri ezinaụlọ ndị tụfuru ndụ ndị nke ha obi tinyekwara obodo dị iche iche emebiri na steeti Plateau. Ha gbara ha ume ka ha kee aji n’ume ma sọpụrụ iwu site n’ịhapụ ndị ọ dị n’aka ka ha mee nyocha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here