Nri emeela emume agwụ nke puku afọ na Nri

0
476
nri

Izunna Okafor

 

OMENALA bụ nnọọ njirimara ndị ma bụrụkwa ebube e ji ama mba n’ọha obodo. Nke a bụ nke pụtara ihè n’anya ụwa na nso nso a dịka imirikiti mmadụ zukọrọ na Nrị, nke dị n’okpuru ọchịchị Anaọcha na steeti Anambra, iji merube mmemme Agwụ, bụ nke malitere kemgbe otu puku afọ gara aga.

Oke omenala ahụ, nke e jiri mmemme pụrụ iche wee merube bụ nke ndị obodo ahụ na-eme kwà afọ, ma bụrụkwa nke ụtọ ya pụtara ihè dịka ndị ogbe dị iche iche na ndị ndu ha tiiri mmọnwụ nke ha ma buru egwu ha wee na-aga n’ọmà ahịa obodo ahụ, bụ ebe ya bụ mmemme nọ wee binwuru ọkụ kpọmkwem.

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, onyeisi ọchịchị nke obodo ahụ, bụ maazị Kelvin Chiedozie mere ka a mara na mmemme omenahọ ahụ bụ nke na-adọkọlọta ụmụafọ Nri niile ọnụ iji gosi na ha bụ otu, ma mee ka a mara na ndị na-akacha agbapụta ìhè na mmemme ahụ bụ ndị ntorobịa, bụkwa nke mezịrị na mmọnwụ ha juputara n’ebe niile.

Ọ gakwara n’ihu kọwaa na mmemme ahụ, bụ nke a na-emekebe n’ọnwa nke Julayị ahọ ọbụla na-abụkwa omenala nkwadó ha maka oge owuwe ihe ubì na-abịa abịa iji kpọkuo mmụọ Agwụ ka o mee ka ihe ha kọrọ n’ubì ruo ihe nke ukwuu, dịka ha si eme emume Ịgụ Arọ n’ọnwa Febụwarị tupuu ha amalite ahọ ọrụ na oge ịkọ ugbo. Ọ sị na mmemme ahụ na-amalite ngwa ngwa ha hụrụ ọnwa ọhụụ, ma kwuo na Chukwu Abịama nyeere ha aka nke ukwuu na nke ahọ a, na-agbanyeghị ihe iche aka mgba dapụtaara ha, ọ kachasị nsogbu dapụtara n’ịzọ onye ga-abụ eze ọdịnala obodo ahụ, nakwa ndị kwe na ndị ekweghị, bụ nke dapụtara n’etiti ha banyere oge a hụrụ ọnwa ọhụụ n’ezie iji malite mmemme ahụ.

GUO:  Enugwu-Ukwu na Agu Ukwu Nri ka na-azọ ndị bụ isi n'ala Igbo

A nọrọ na mmemme ahụ gọọ ọfọ ndụ, akụnụba na ahụ ike, kpee ekpere maka udo steeti Anambra, ụmụafọ Igbo na ala Nigeria n’izùgbe, gbaa egwu mmọnwụ ma mekwazie omenala ndị ọzọ dị iche iche, bụ nke gosiri n’ezie na ọ bụ omenala Agwụ ka a bịara.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here