A dụọla ndị ọlụ ahụike ka ha dị uchu n’ọlụ

0
482
ahụike

Izunna Okafor

 

A KPỌKUOLA ma dụọ ndị ọrụ ahụike ka ha gaa n’ihu n’itinye uchu n’ọrụ ha ma werekwa ya dịka ọkpụkpọ òkù iji wee mee ka mma ọrụ ha pụtawanye ihè.

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nyere ndụmọdụ a ma kpọọ oku a dịka o guzobere otu jikọtara ndị ọrụ ahụike na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị, bụ nke weere ọnọdụ n’isi ụlọ ọrụ steeti ahụ dị n’Awka, ma bụrụkwa nke dọtara ndị ọrụ ahụike sitere steeti ise dị na mpaghara ala Igbo.

N’okwu ya ka ọ na-eguzobe ndị otù ahụ, Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ osote onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọgwụ n’ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka ahụike, bụ Maazị Azụbụike Nwizu toro ndị òtù ahụ maka mbọ dị iche iche ha na-agba n’ịkwalite ezi ọnọdụ ahụike ụmụ mmadụ, ọ kachasị ndị nọ n’ime ime obodo, ma kwe nkwà na ọchịchị ya ga-aga n’ihu n’inye ha nkwàdo na ịdọnyere ha ukwu, dịka ha si ákwàdó ụlọ ọrụ na otu ọbụla na-agba mbọ ịkwàlite ọdịmma ụmụ mmadụ.

O kwuru na ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ ga-aga n’ihu n’inye ụmụafọ steeti Anambra ezi ọnọdụ ahụike dị n’ogoogo nke mba ụwa, bụ nke mere na ọ na-agbata ọsọ enyemaka ma na-enyekwa nkwàdo kwesiri ekwesi na ngalaba ọnọdụ ahụike nke steeti ahụ, ma kpọkuzie ha ka ha tinye uche ma jisie ike n’ọrụ ha oge ọbụla ma werekwa ya kpọrọ ihe.

N’okwu nke ya, onyeisi ndị otu ahụ, bụ Maazị Bekee Igbojiọnụ kelere Gọvanọ Obianọ maka ịnabata ha, kwuo na otù ahụ dị njikere inyere gọọmenti aka oge ọbụla n’ihe gbasaara ọnọdụ ahụike, ma kwuo na ha arụọla ọrụ ahụike pụtara ihè n’ebe dị iche iche na mpaghara ahụ, dịka ọ kpọkukwara gọọmenti ka ha kwàdó ha nke ọma iji nyere ha aka mee ka ebumnobi ha pụta ihè.

GUO:  Obianọ agbapeela izuụka ahụike ụmụaka, ndị nne, na ndị mụrụ nwa ọhụrụ

Na ntụye nke ya, onyeisi oche ndị otu ahụ na steeti Anambra, bụ Oriakụ Benedicta Lotenna kwuru na ndị otu ahụ pụtara igbochi ndapụta na mgbasawanye nke ụfọdụ ọrịa na-efe èfè site n’ime nnyocha miri emì banyere ya nakwa site na nkwàdo gọọmenti.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here