Imebisi ala n’ala Igbo
Pita Ejiọfọ
IHE a na-aya taa n’ala Igbo,
Bụ enweghị ọrụ ndị ntorobịa,
Ntorobịa gụwachaa isi na mahadum,
Ọ chọwazịa ọrụ ọ ga-arụ, ma ya ahụla.
Na ọrụ adịghị n’ala Igbo,
Bụ n’iihi na ịndọstrị adịghị,
Naanị ahịa na Gooment juru ebe niile,
Ma indọstrị na-enye ọrụ, adịghị maọlị.
Asambodo bachaa akpa, nkwụgharị eweghara,
A gbagoo Ugwu, gbadaa Legọs,
Pụgawa ịkpa Sahara, chọwa ụzọ Yụroopu.
Wụwa babwaya, n’Embasii Amerika,
Ebe a na-agbakwu, bụkwa ikikereeze:
Ọ bụghị ire ahịa n’okporoụzọ Legọs,
Ọ bụrụ “grajụati” ịbụ onyenche anyasị,
Ụfọdụ agbawa akwụna na Jọs na Kanọ.
Ọ kwanụ otua ka echi ntorobịa Igbo dịzị.
N’ihi ịndọstrị adịghị n’ala Igbo,
N’ihi na a sị na Igbo enweghị ala ịndọstrị,
Nke bụ agbaagba asị, na-edufie anyị ụzọ.
Ala juru eju, bara abara n’ala Igbo.
Ma n’ime mba niile dị n’ụwa taa,
Igbo gbara ndị mbụ, n’imebisi ala,
Wee biri na mmiri, ncha na-aba ha anya.
Leenụ ala ebe a rụrụ ụlọ obibi otu onye,
Ngwuru ya ha ka ama egwuregwu Olimpic,
E gbusichaa osisi, kpọkuo idei na mbuze,
Afọ na-aga, obosara ngwuru ana-ebuwanye.
Enu ajangwuru kakwa otu dimkpa n’ogo,
Ụlọ n’onwe ya, ha ka be President Amerịka,
A rụchaa, a kpọchie, chịrị kii, laa obodo ọzọ,
Oke na ụchụcha ebichie, na-amụ, na-abasa.
Olee ime obodo ala Igbo ụdị ụlọ a ejuputaghị?
Ebe niile ọ bụrụ, ajaaja ụlọ na oke ngwuru,
Ego e jiri rụ otu arụtachara ịndọstrị abụọ,
Obosara ala ụlọ atọ, ọ bachaa ụlọọrụ Dangote.
Olee mbaụwa ọzọ a ka na-emebisi ala otu a?
Obodo niile na-ewu taa, akwụsịla ya kemgbe,
Gaa Japan na Chaịna ka ị ghọta ihe a na-ekwu.
N’ama, n’ama, ka ụlọ ime obodo niile dị.
Ala wee bụrụ nyafụụ, tọgbọrọ maka ịndọstrị,
Traktọ enwee oghere, kọrụ nri na-aga,
Ịzu ehi na atụrụ n’igwe, na-aga nke ọma,
Ọrụ dị maka onye ọbụla, be ha wee kwụrụ.
O nweghị ndị pụrụ be ha, ga-mepee ala ndị ọzọ,
Achụpụghị n’ike, ha were anya mmiri ọzọ,
Cheta Izrel n’Ijiputụ na ndị Ghana na Naịjirịa
Ugboro ole ka ọ ga-eme Igbo, Igbo ewee mụta ihe,
Ụnụ ka ekwe a na-akpọ, Goomenti ala Igbo,
Tọpụnụ ndị Igbo n’ụdọ a, iwu ulọ kere ha,
Hazienụ ime obodo ka mba ndị ọzọ siri mee,
Ka ala pụta maka ịndọstrị, ka ọrụ wee dịwa.