E gbuola onye Nigeria ọzọ na South Africa

0
758
Ndi Nigeria na South Africa

Chinwendu Uzoatu

 

NDỊ Nigeria bi South Africa ekwuputana nwute ha maka ogbubu e gburu onye Nigeria ọzọ, Maazị Martins  Ebuzoeme, site n’aka ndị a maghị.

Onye isi oche otu jikọtara ndị Nigeria bi South Africa ‘Nigeria Union in South Africa,’ Adetola Olubola, kwuru na e gburu nwa amadị ahụ na Yeovilie Johannesburg n’ihe dịka elekere nke asaa na ọkara nke uhuru chi ka ọnwa Julai dị na mkpụrụ ụbọchị iri na abụọ.

 

Mkpamkpa a kpara ka o mechara ihe dịka otu ụbọchị onye isi ala South Africa, ‘President’ Cyril Ramaphosa bịachara njem n’ala Nigeria.

Ramaphosa na njem ahụ, nke o mere ka ọnwa Julai dị na mkpụrụ ụbọchị iri na otu, kwuru na ogbugbu a na-egbu ndị Nigeria na ndị mba ndị ọzọ na South Africa bụ nke ndị omekome na-eme nke n’abụghịkwanụ maka nanị ndị Nigeria.

 

O kwuru si “ihe pkatara ogbugbu a bụ n’ihi ụkọ ọlụ nke dị n’etiti ndị ntorobịa, tinyekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ nke sitere n’ogologo ọchịchị mmegide nke ndị isi ojii.

“Otu o sina dị, gọọmentị na-agbasi mbọ ike iji wee kwụsị ya.”

‘Nigeria Council General’ na mba Johannesburg, Maazị Godwin Adama, kwuru na ogbugbu nke a enweghị ihe jikọtara ya na mmegide a na-emegide ndị mba ọzọ.

 

Adama gakwara n’ihu kwuo na mpaghara ebe egburu onye nke a bụ akụkụ ndị omekome na-akpaba ike na mba ahụ.

 

Ọ gara n’ihu kwuo na kemgbe otu afọ na e gbuola mmadụ puku iri na isii ndị esighi n’otu agbụrụ ma ọ bụ obodo wee pụta. Ndị nta akụkọ chọpụtara na tupu nkea e mee, e gbuola ọtụtụ ndị Nigeria na nwa mgbe gara aga na mba South Africa, ndị gụnyere Ozumba Tochukwu Lawrence, onye egburu na Julai 6; ThankGod Okoro (Aprel 9); Clement Nwago (Aprel).

GUO:  S'Africa achọọla mmekọ ha n'Anambra

N’ihi nkea, anwuchikọrọ ụmụ Nigeria mmadụ iri na anọ ma tụkpuo ha n’ụlọ itiri n’ihi na e gburu ụmụnne ha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here