E keela otu nwoke kwasara nwa afọ asaa iko agbụ, pịa ya itarị

0
544
ịkwa iko
Tenimu na ndị na-ekiri ya mgbe a na-ata ya ahụhụ.

Izunna Okafor

 

ỤBỌCHỊ bụụrụ nnọọ otu nwoke e tie okwe e rie oke n’isi ngwụcha izu ụka gara aga dịka ụmụ okorobịa iwe juru obi kere ya agbụ, wụọ ya agbara aka n’ahụ ma were ụtarị pịa ya tọọ tọọ maka ịkwaso nwata gbara naanị ahọ asaa.

Nwa amadi ahụ, bụ Maazị Tenimu, bụ onye a kọwara na ọ bụ onye a tụbụrụ nga na mgbe gara, ma bụrụkwa onye ji anya ya wee hụ ntị ya ụbọchị ahụ dịka a tụụrụ ya ụtụ aka n’obodo Odion nke Warri dị na steeti Delta.

Dịka akụkọ siri kọọ, oge nwa amadi ahụ kwetachaara na ọ rụrụ arụrụ ala ahụ n’eziokwu, ụmụ okorobịa ahụ jiri iwe kee ya n’osisi wee họọ ya aka uru họrọ ogbe ogiri, dịka ọ kọọrọ ha na o jiri aghụghọ ràra nwata ahụ wee dubaa ya n’ebe ahụ ọ nọrọ wee rie ya ọkọmbọ.

N’akụkọ dịkwa ka ibè ya, otu nwoke ọzọ gbara ahọ iri na iteghete emebiela nwata nwaanyị na steeti Mina site n’ịkwaso ya iko.

Oge a gbara ya ajụjụ banyere nke ahụ, ya bụ nwoke onye kọwara onwe ya dịka Abdullahi Abubakar kwuru na ịhụnanya o nwere n’ebe nwata ahụ nọ na-egbu ya ka mmanya, nke na o nweghị ike ileghara ya anya ka ọ gaa, bụzị nke mere ka o kpọọ ya ma rie ya ọkọmbọ, ma sịkwazie na o kwasola ya iko ihe karịrị ugboro atọ.

GUO:  A tụọla otu nwoke nga maka ịkwasa nwa afọ anọ iko n'ike

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here