Mba China ga-alụnye ụlọ ọlụ ukwu n’Onitsha

0
584
Mba China

Izunna Okafor

ỤLỌ ọrụ mba China, bụ ‘Oriental Golden Promise’ egosipụtala mmasị ha iwunye ụlọ ọrụ ukwu n’Ọnịtsha nke steeti Anambra.

Ụlọ ọrụ ahụ, bụ nke jikọrọ aka ọnụ ya na ụlọ ọrụ ‘China Communication Construction Company’ na ụlọ ọrụ ‘Inland Water Ways Authority’ gosipụtara ma kwupụta mmasị a n’ọbịbịa ha bịara izute ọchịchị steeti ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n’obi gọọmenti dị n’Awka, bụ ebe aka na-achị steeti ahụ nọrọ wee nabata ha.

N’okwu ya n’ọgbakọ ahụ, onyeisi ụlọ ọrụ Golden Promise, bụ Maazị Bob Wang kọwara ihe dị iche iche ụlọ ọrụ ahụ na-eme, kwuo na ha nwekwara ụzọ awara a pụrụ isite na ya buru ngwa ahịa si mba China bata Lagos n’ụgbọ mmiri, ma sịkwa na ha chọrọ ka steeti Anambra sorokwa rite uru n’ihe dị iche iche ụlọ ọrụ ahụ na-eme, bụzị nke mere ha jiri si mbà China chọrọ steeti ahụ bịa.

N’okwu dịkwa ka ibè ya, osote onyeisi ụlọ ọrụ ahụ, bụ Maazị Sisley Yang mere ka a mara na ha bụ ọkàibe n’akụrụngwa mmepe obodo, ma kwuo na ha bịara ka ha gbanyekwa ngbọrọgwụ n’Ọnịtsha iji wee sonye n’irita urù n’ohere dị iche iche juputara na steeti ahụ, ọ kachasị n’ihi nnukwu ahịa mba ụwa ahụ dị n’Ọnịtsha.

N’okwu nke ya, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, nke osote ya bụ Dọkịịta Nkem Okeke nọchitere anya ya kọwara nke ahụ dịka nke magburu onwe ya, ọ bụnadị dịka o mere ka a mara na steeti ahụ bụ nnọọ ebe nlegara anya pụrụ ichè maka ihe mwunye. O gosipụtara mmasị steeti ahụ imekọ ihe ọnụ, ya na ụlọ ọrụ ahụ. O kwuru na steeti ahụ nwere ohere dị larịị na ọnọdụ nchekwa bụ ịgbà maka ịdọta na ichekwaba ihe mwunye, bụ nke mezịrị ndị mmadụ na ụlọ ọrụ dị iche iche ji achọrọ ha abịa, maka na ahịa ọma na-ere onwe ya.

GUO:  Ụlọ etigbuola otu obere nwa n'Ọnịtsha

Ọ sị na gọọmenti etiti akwàlitela ụfọdụ akụrụngwa dị n’ọdụ ụgbọ mmiri Ọnịtsha iji mee ka o nwee ike ibu ụgbọ mmiri buru ibù, ma kwuo na steeti ahụ chọkwara ka a kwalitekwuo ọkụ latiriiki na steeti ahụ iji mee ka ụlọ ọrụ dị iche were ọkụ latiriiki na-arụ ọrụ gbaanyụụ.

Dọkịnta Okeke gakwara n’ihu mee ka a mara na ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ nwere ezi mmasị ịkwalitekwu na inwogharị nnukwu ahịa Ọnịtsha ahụ n’ụdị ahịa ọgbara ọhụụ na iji mee ka mma ya pụtawanye ihè n’ogoogo mba ụwa, ma kpọkuokwa ụlọ ọrụ ahụ ka ha kpara ya bụ ọjị nkụ, ọ bụnadị dịka ọ dụkwara ha ka ha rụkọọ nke ọma, ha na ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka ịkwalite na ichekwaba ihe mwunye na steeti ahụ bụ ụlọ ọrụ ANSIPPA iji mee ka ya bụ oziọma ha jiri bịa bụrụ nke pụtara ihè.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here