Ndị Okpokò ahọpụtala ndị ndu ọhụrụ

0
640
Ndị Okpokò

Izunna Okafor

 

ỌÑỤ dara nnọọ n’Okpoko nke dị n’okpuru ọchịchị Ọgbaru nke steeti Anambra dịka ndị obodo ahụ nupụtara n’ìgwè wee họpụta ndị ndu ọhụụ, bụkwazị nke mere ka nsogbu ahụ gbagoro ahọ iri na otu n’obodo ahụ banyere ịzọ ọkwa onye ndu, bịa n’isi njedobe.

Nhọpụta ahụ dara ụdà bụ nke weere ọnọdụ n’ihi nkabì ikpe nke otu ụlọ ikpe mere na ntụzi aka ha nyere n’ụbọchị abụọ nke ọnwa a, bụ nke kwadoro akwụkwọ iwu na-achị obodo ahụ, bụ nke e guzobere n’ahọ 1994, dịka e siri degharịa ya, bụkwazị nke ụlọ ikpe ahụ gbakwasara ụkwụ na ya wee nye ntụzi aka ka e mee nhọpụta ahụ. Nke ahụ bụzị nke e lekwasịrị anya wee guzobe otu chịkọbara ya bụ nhọpụta, n’okpuru nleru anya nke ministịrị steeti ahụ na-ahụ maka ihe gbasaara okpuru ọchịchị, ichi echichi na ọchịchị ime ime obodo.

A nọrọ n’ịtụ akwụkwọ ahụ wee họpụta ndị ndu ọhụụ ga-eji ọkwa dị iche iche n’ọchịchị obodo ahụ, nke gụnyere Maazị Francisi Enemụọ (onyeisi), Maazị Raphael Agụ (Ode akwụkwọ), tinyere ọtụtụ ndị ọzọ a họpụtara n’ọkwa dị iche iche.

N’okwu ya ka e mechara nhọpụta ahụ, ya bụ nwa amadi tuuru ugo dịka onye isi, bụ Maazị Francis Enemụọ kelere ìgwè mmadụ ahụ maka ịpụta n’uju ma sonye na ya bụ nhọpụta, ọ kachasị site n’ịtụnyere ha iji gosipụta ezi ntụkwasịobi ha nwere na ha na ihe ha pụrụ ime, ma kwe nkwa na ha agaghị agharịpụ obodo ahụ. O toro ndị haziri ya bụ nhọpụta na ndị leruru ya anya iji hụ na ọ gara nke ọma, too ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ, ma kwe nkwà na ha ga-aga n’ihu ijikọ aka ọnụ, ya na ọchịchị steeti ahụ iji kwalite ya bụ ọrụ mmepe na-aga n’ihu.

N’okwu ha n’otu n’otu, onye na-anọchite anya ọgbọnta nkwado Ọgbaru nke mbụ n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ, bụ maazị Benson Nwawulu, osote onyeisi oche nchere ogè n’okpuru ọchịchị Ọgbaru bụ Maazị Chimezie Osuigwe, na nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ n’ihe gbasaara mmekọrịta ya na ime ime obodo, bụ Maazị Ephraim Mmadụ toro ndị ahụ tuuru ugo, nye ha ndụmọdụ pụrụ iche iji wee chịa ezi ọchịchị, ma kpọkuokwa ha ka ha lebà anya n’ụfọdụ ụtụ isi dị iche iche a na-atụ n’obodo ahụ ma mekwa ihe ndị ọzọ ha pụrụ ime ka udo ahụ batagoro n’obodo ahụ bụrụ nke ga-adị ọkpụtọrọkpụ.

Nhọpụta ahụ bụ nke dọtara imirikiti ụmụafọ Okpoko na ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu n’obodo ahụ, nke gụnyere onyeisi otu jikọtara ndị nze na ọzọ n’obodo ahụ, bụ Maazị Emmanuel Obiekwe, onyeisi otu jikọtara ndị nwere ụlọ n’Okpoko, bụ Maazị Felix Ọnụnkwọ, ndị chịgoro obodo ahụ n’oge gara aga, tinyere ndị nnọchi anya ime mkpu dị iche iche e nwere n’obodo ahụ.

 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here