N’Imo, ndị ụka ‘Anglican’ emeela ngagharị ka bishọọpụ ha nye ohere

0
597
ndị ụka 'Anglican

Chinwendu Uzoatu

 

IMIRIKITI ndị ụka ‘St Mary Magdaline Cathedral Anglican Communion’ nke dị n’okpuru ọchịchị Oguta na steeti Imo, agwala onye isi ụka ha, Bishọọpụ Chijioke Benjamin Oti, ka o nye ohere n’ụlọụka.

Ha gbara iwe ma buruchaa mpempe akwụkwọ ha depụtachara ebumnuche ha na ya nọchie ọnụ ụzọ ụlọụka ahụ. Ha nọ na-ekwu na ọmasịghị ha otu ihe si aga n’ụlọụka ahụ.

Ndị ụka ahụ na ngaghari iwe ahụ kwuru na o wutere ha otu o si wepu otu ụkọchukwu ha bụ ‘Rev’ Jasper Chikwe n’ihi ebubo; ha kwukwara na bishọọpụ ahụ egeghị nti na mbọ ndị okenye ụka ahụ gbara iji lebaa okwu ahụ anya ka udo wee chịa.

Maazị Isreal Onyeoyibo kwuru na ụlọụka ahụ anaghị amịta mmịmị otu o kwesiri n’okpuru ọchịchị Bishọọpụ Oti.

Ọ gara n’ihu kwuo na ọ na-achị ha n’aka ike dị egwu nke bụ na ụtụ (levy) na-achọzị igbu ha.
Dịka o siri kwu; “N’okpuru Bishọọpụ Oti, ihe esila na Kraist pụọ na-agazi n’ego; nke a na-akpata ọtụtụ nsogbu.

Site n’ụzọ dị otu a, ndụ mmụọ nke ụlọụka a na-anwuzi anwụ.”
N’aka nke ya, Oriaku Joy Nnani kwuru na ngagharị iwe ha na-eme bụ maka na bishọọpụ ha adala mba n’iwulite ndụ nke mmụọ ha ma kpọkwa ekwo nkụ. Ọ kwadakwara ọtụtụ mbọ anyị gbarala maka ọdị mma ụlọụka ahụ.

Mbọ nile ndị nta akụkọ gbara maka ịnụ ọlụ bishọọpụ Oti mara afọ n’ala.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here