Udodimma ‘Primary School’ Okpuno e meela emume nturu ugo mmụta

0
701
ụmụ akwụkwọ
Ụfọdụ ụmụaka ndị tuuru ugo na ọtaakara (nursery) mgbe ha nọ na mmemme ahụ.

Chinwendu Uzoatu

 

EMUME nturu ugo mmụta dara ụda n’Udokamma ‘Primary School’ Okpuno, nke dị n’okpuro ọchịchị Awka ‘South’ na steeti Anambra, ụbọchị ụka gara aga

Onye nlekọta ụlọakwụkwọ ahụ bụ Rev Fr. Fidelis Chijioke Izuakor, nọkwazi ụbọchị ahụ cheta otu afọ o ji chie ụkọchukwu.

E ji aja maasị dị asọ wee malite mmemme a na ‘St Gabriel’s Catholic Church,’ Okpuno, ebe a nọ kelee Chineke maka afọ ọma ya. Mgbe a gbasara ụka ka a nọzị n’ihu ụlọakwụkwọ ahụ nke dịkwazị n’ogige ụlọ ụka ahụ wee metọpụ mmemme. Ndị mmadụ si n’ugwu na ndida ju ka igwurube wee nonye ma nye nkwado ha.

‘Rev Fr. Prof.’ John Oraemesi, n’ekpere mmalite, kenere Chineke ma hafee ihe nile n’aka ya ebe ụkọchukwu parish bụ Rev. Fr. Anthony Nwafor, mgbe ọ na-agọ ọji gọtaara mmadụ nile ndụ makana oke dibịa chụọ aja, ọ dịka e were ya nye ndị mmụọ n’aka.

Onye isi oche mmemme ahụ bụ Walter Umeukeje nyere ha nkwado ya ma jakwaa ha ike.
N’okwu nke ya, onye nlekọta ụlọakwụkwọ ahụ bụ ‘Rev Fr’. Fidelis Izuako kelere Chineke maka ụbọchị ahụ tinyekwara na ọ bụ ụbọchị ahụ ka o mere otu afọ o jiri chie ụkọchukwu. Dịka o kelere Chineke ka ọ rịọkwara ya amara ya maka njem ụkọchukwu ya.

N’adreesị nke ọ gụpụtara, onye isi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Oriaku Mary Attah kelere ndị zara ha oku ma rụtụkwara ha aka n’ihe olemole makana a nyụkọọ mamịrị ọnụ ọ gbaa ụfụfụ.

Otu onye nkuzi aha ya bụ Oriaku Victoria gosiri afọ ojuju o nwere maka emume nturu ugo ahụ ma kọwakwaa na ụmụakwụkwọ ha bụ ndị tuuru ugo na nta akara tinyekwara ndị ga-abazi kọleji nwere ezigbo añụrị.

GUO:  A dụọla ụmụakwụkwọ ka ha na-adị nkwado maka ohere ọrụ

Elizabeth Ilonwa, bụ onye na-aga ụka na St ‘Gabriel Parish’ ma sorokwa n’otu jikọtara ndị nne, nna na ndị nkuzi (P.T.A), jara ụmụaka ahụ ike maka ime ka ụbọchị ahụ bụrụ ụbọchị pụrụ iche. O kwuru na ọ na-aghọ nkọ ka aguba.

E mere ọtụtụ ihe ngosi na mmemme ahụ, nke gụnyere akụkọ ụwa, abụ, ịwa achịcha, egwu dị iche iche, wdg. E nyekwara ọtụtụ ndị mmadụ onyinye nkwanye ugwu ‘award’.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here