Ụlọ elu okpukpu anọ adaala n’Obosi

0
807
Obosi

Chinwendu Uzoatu

 

ỤLỌ elu nwere okpukpu anọ adaala kpamkpam n’Owelle-Aja, Obosi, nke dị n’okpuru ọchịchị Idemili North na steeti Anambra.

Ụlọ ahụ, nke nọzi n’ogo ilụchapụ ya daruru ala na ngwụcha izuụka gara aga n’ihe dịka elekere asaa nke ụtụtụ; mana onweghị onye ọbụna tufuru ndụ ya.

A na-akọwa na e meburu ntọala (foundation) ụlọ a maka okpukpu abụọ mana onye nwe ya mechara n’ikpeazu tinyekwuo okpukpu abụọ ọzọ na ya. Nke a metụtara ntọala ụlọ a nke na o nweghịkwa ike ibuli ya, o wee daa.

Ụfọdụ ndị mmadụ bi n’okirikiri ahụ, tinyekwara ndị gbatara ọsọ kwuru na ụlọ ahụ nwegasịrị mgbawa n’ahụ ya tupu e tinyekwuo ya okpukpu abụọ ọzọ. Ha kwuru na ọ bụ nkea nwere ike ime o jiri wee da.
Tochukwu Nwkodi kwuru na ala ebe ahụ esighị ike, na ọ dị nro nke ukwu nke mere na mmiri ga na-asacha ya n’egbughị oge. Ọ gara n’ihu kwuo na o nweghị mgbe ogologo ụlọ ga-akwudo n’ebe ahụ.

“Anyị anaghị alụ ụdị ụlọ ahụ ebe a. Ihe ịga ahụ ebe a bụ ụlọ elu okpukpu abụọ. Onye ọbụla gafere nkea achọghị ka ụlọ ya kwụrụ. Ụlọ ahụ anọkwala ọtụtụ afọ na mmiri na anwụ nke nwere ike ime ka ọ daa.”

GUO:  Anambra: Ụlọ etigbuola nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ n'Obosi

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here