Uru na ọghọm dị n’ịzụ nwata n’ime obodo na obodo mepere emepe

0
821
ịzụ nwa

Uchenwa Mba

 

IZU nwata sitere na udi nne na nna onye nwere. Ọ bụ ezie na gburugburu nwata nọ too nwere ihe o nwere ime na ndụ nwata ọ bụla. Ezinaụlọ ọ bụla nwere ezigbo nne na nne mara ihe ma nwee nsọpụrụ na onwe ha, ụmụ ha na a bụ ndị maara ihe n’ihi na ha ga-azụ ha na ụzọ kwesiri. N’ezie, ihe ọ bụla nwere uru nwere ọghọm.

Izu nwata n’obodo mepere emepe dị mma nke ukwu. Ọ ga-eme nwata ahụ ka ọ mara ihe ọsọsọ. N’ọnọdụ agụmakwụkwọ, ọ ga-aka ndị ọgbọ ya nọ n’ime obodo mara akwụkwọ.
Ọzọ, ọ ga-akakwa ọgbọ ya nọ n’ime obodo mara uru akwụkwọ bara. Ndị nọ n’obodo mepere emepe na-ebu ndị ọgbọ ha nọ n’ime obodo ụzọ mara ihe gbasara ‘computer’. Ha kakwa ọgbọ ha nọ n’ime obodo eke ekike.

Ebe ụfọdụ ndị a zụrụ n’obodo mepere emepe nwere nsogbụ bụ na ozi ụlọ n’ihi na ndị mụrụ ha na-akpọta ndị na eje ozi debere ha, ha adighị ama otu e si eje ozi nke ọma.
Ụfọdụ n’ime ha bụ sọ ihe ha mara bụ ịwụ arụ, ị rarụ ụra, rie nri, gụọ akwụkwọ, lelee ihe onyonyoo na ihe nile mere n’ekwe ntị. Ọtụtụ n’ime ha amaghị ihe bụ nsọpụrụ nye onye tọrọ ha, ụfọdụ n’ime ha amaghị ka e si ekwu okwu n’ọgbọ.

Mana nwata a zụrụ n’ime obodo na-enwe nrube isi, nkwanye ugwu na nsọpụrụ nye onye ọ bụla bịara ya nso mana ha adịghị amacha akwụkwọ ka ndị ọgbọ ha nọ n’obodo mepere emepe.

 

Ụfọdụ ihe na-akpaata nke a bụ na ha adighị enwe ndị nkuzi chapụrụ nke ọma.
Otu nwanyị onye ọlụ anyị jụrụ ajụjụ ọnụ maka isi okwu a, aha ya bụ Ngozi Obunwaka, na-alụ n’ụlọ ọlụ Awka South ‘Local Government Area’, kwuru na onye a zụrụ n’obodo mepere emepe nwere ọtụtụ ihe o ji dị iche n’ebe nwata azụrụ n’ime obodo nọ.

 

“ Ndị a zụrụ n’obodo mepere emepe nwere ọtụtụ ihe ha na-ebido na nwata na-ahụ karịa ndị ọgbọ ha nọ n’ime obodo. Nke mbụ bụ na ha na-ahụ ọkụ eletriki, ezi okporo ụzọ, ụlọ dị mma, nri dị mma, akwa dị mma, ezi akpụkpụ ụkwụ, ezi mmiri ọñụñụ, ebe a na-agụ akwụkwọ dị mma, ma ụlọakwụkwọ gọọmentị ma nke otu onye nwe. N’obodo mepere emepe, e nwere ezigbo ụlọ ọgwụ ma n’ime obodo na-abukarị ‘health centre’.

 

Ọ bụrụ na e nwee ezigbo ụlọ ọgwụ gọọmentị n’ime obodo, a dịghị enwe ezigbo ndị ọlụ ahụike nakwa ezigbo ọgwụ na akụrụ ngwa ọlụ e ji alụ ọlụ n’ebe ahụ. Ọzụzụ nwa sitere ka nne na nna siri mara ihe mana akwụkwọ nsọ kwuru n’akwụkwọ Ilu isii, amaokwu iri abụọ na abụọ ruo na nke isii: “zulite nwata dịka ụzọ ya si dị, ọ bụna mgbe o mere okenye, ọ gaghị esi n’ime ya wezuga onwe ya”.

 

Nwata dịka ome ji. A na-ekozi ome ji, ọ gaghị agbasa aka ya ebe okwesighị ka ọ gaa.
Ọ bụchaghị ebe a nọrọ zụọ nwata kama ọ bụ otu onye siri zụọ nke ya, maka oge ụfọdụ, ị gaghị ama na nwata esorola ndị ọgbọ ya, ma nke nọ n’ime obodo ma nke nọ n’obodo mepere emepe na- eme ihe ị maghị.

 

Oge ụfọdụ, nke nwanyị a tụrụ ime, nke nwoke a baa otu ọjọọ. O kwesịrị ka nne na nna ọ bụla gbaa mbọ ị zụlite nwa ha n’egwu Chineke maka n’akwụkwọ nsọ kwuru, “ịtụ egwu Jehova bụ mmalite amamihe”.
Obunwaka kwuru na n’uche ya, n’ịzụ nwata n’obodo mepere emepe ka mma n’ihi na ọ ga-eme ka amamihe ya gbasa nke ọma.

I ji ma atụ, n’ihe gbasara ‘computer’, o kwuru n’ụmụaka nọ n’obodo mepere emepe maara ya karia ndị nọ n’ime obodo.
N’akụkụ irube isi, o kwuru n’ụmụaka a zụrụ n’ime obodo na-aka erube isi na akwanyere mmadụ ugwu karia ndị nọ n’obodo mepere emepe. N’agụmakwụkwọ, o kwuru na ndị nọ n’ime obodo na-erubere ndị nkuzi ha isi n’ihi na nne na nna ha agaghị eje ụlọ akwụkwọ ị lụrụ ha ọgụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here