A kwatuela ụlọ otu onye isi ntọrị mmadụ n’Imo

0
681
onye ntọrị

Chinwendu Uzoatu

 

GỌỌMENTI steeti Imo akwariela ụlọ isii nke otu onye isi otu ntọrị mmadụ (kidnapper) aha ya bụ Ikenna Nwosu, onye e ji Ezego wee mara.

Onye na-ahụ maka ọdị mma ndị mmadụ na ndị uweoji ‘Police Public Relations Officer (PPRO)’, Andrew Enwerem, kwupụtara na nkea bụ eziokwu.

Ezego, onye gbara, afọ iri anọ na atọ ma bụrụkwa onye Ọkwụdọ, Mgbidi, nke dị n’okpuru ọchịchị Oru West na steeti ahụ, kwere ma kwupụta na ya bụ onye ndu otu ndị tọọrọ ma gbuo otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị, Maazị Amos Akano, ka a kwụchara ha ụgwọ nde naira ise.

Dịka Enwerem bụ onye okwupụta okwu ndị uweojii si kọwaa,site na nnyocha ntọrọ na ogbugbu nke e gburu Amos Akano, onye Nkwere; ndị ọlụ ‘Federal SARS Imo Command’ nwụchiri mmadụ ise, ha wee kwupụta otu ha si kpaa nkpankpa ahụ.

Gọọmentị steeti Imo gbasooro iwu steeti ahụ wee kwarie ụlọ onye ndu ndị ntọrị ahụ.
Dịka Enwerem si kwu; “ihe dịka ụlọ isii ka gọọmentị steeti a kwariri. Ndị Oru West nupụtara n’igwe n’ọñụ maka ihe gọọmentị steeti a mere.

“Nke a, dịka gọọmentị steeti siri kwu, ga-eme ka ndị mmadụ gbaara ihe ọjọọ ọsọ.”

 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here