Buharị kwesịrị ịga zuo ike – Oyedepo

0
653
Oyedepo

Izunna Okafor

 

ONYE ndu ụlọ ụka Living Faith Church n’ụwa gbaa gburu gburu, bụ Bishọọpụ David Oyedepo akpọkuola onyeisi ala anyị bụ Mụhammadụ Buharị ma rịọ ya doo doo doo ka o gazie zuo ike gwụrụ ya agwụ site n’ịgba a rụkwaghị m n’ọkwa ya dịka onyeisi ala, n’ihi idà mbà ya n’ọrụ.

 

Maazị Oyedepọ kpọrọ oku a ụbọchị ụka gara aga n’ozi ọma ya n’Ọta, nke steeti Ogun, bụkwazị nke mere ka o soro n’otu n’ime ọtụtụ ndị isi ụka dị iche iche gwagoro ya bụ onyeisi Buharị ka ọ gbaa a rụkwaghị m ma were nwayọ ga zuo ike gwụrụ ya agwụ.

 

Na ya bụ okwuchukwu, ọ gwara ndị ụka ya na ọ bụ eziokwu bụ na o nweghị otu ndọrọ ndọrọ ọbụla ọ nọ na ya, mana ya agaghị adị ndụ gbachị nkịtị banyere otu ndị Fụlani na-achị ehi si egbusi ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha na mpaghara ebe dị iche iche n’ala anyị. Ọ jụrụ ajụjụ banyere ihe o jiri bụrụ naanị na mpaghara ebe ndị otu Christi jupụtara ka ihe ahụ na-eme, na ihe mere na o nwebeghị otu onye n’ime ndị Fụlani ahụ a nwụchikọgoro ma ọ bụ kpụpụ ya ụlọ ikpe, na-agbanyeghị ọtụtụ ọbara ha kwafugoro kemgbe ha jiri nyebe nsogbu.

 

O kwuru na oge eruola mgbe ndị ụka ga-eteta n’ụra n’ihi na ya bụ ihe na-akwadozị ịgafe ihe e chere na ọ bụ ya, maka na ndị Fụlani na-achi ehi n’eziokwu adịghị achọ nsogbu, ma ya fọdụzie ibu egbe, mana ndị nke a na-eme mkpamkpa ugbu a na-eme ihe ọbụla kwere ha omume, dịka a ga-asị na ha bụ ndị otu dị iche na-eme ihe ọzọ ma were Fụlani na-achị ehi na-azara aha.

GUO:  Korona: Buharị agbatịkwuola oge onye apụtakwala ezi n’Abuja, Lagos, Ogun

 

Ọ kpọpụtasịrị ụfọdụ arụrụ ala dị iche iche ndị otu ahụ rụgoro, ma kpọkuo ụmụafọ Nigeria ka ha gharakwa iwepụta ala ọbụla maka ebe a ga na-azụ ehi, dịka gọọmenti etiti siri nye ntụzi aka, ọbụnadị dịka o fooro ntutu taa sị na o nweghị ihe ga-eme ka ala Nigeria bụrụ ala Fụlani ma ọ bụ okpukperechi Alakụba.

 

O kwuru na ihe a na-atụ anya n’aka onye ndu ọbụla amaghị ọrụ ya bụ ka o were nwayọ kwanyere onwe ya ùgwù ma gbaa a rụkwaghị m, ma kpọkuzie Maazị Buharị ka o mee ihe ndị mmadụ na-atụ anya ya, bụ ịnọzụga n’otu akụkụ ka ndị ma ihe ekwe na-akụ weghara ọnọdụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here