Gov. Obianọ, ụmụnne ya emeela ncheta nne na nna ha

0
715
Obiano
Gọvanọ Obiano (n'etiti) na ụmụnne ya (n'aka ekpe), mgbe ha na-achọ idebe okooko n'ili nne na nna ha na mmemme ahụ.

Ọ BỤ nnọ nnukwu ụbọchị ncheta n’Agụleri ụbọchị Mọnde dịka aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ na ụmụnne ya kaara nne na nna ha bụ Maazị Philip na Oriakụ Christiana Obianọ lagoro mmụọ ụka pụrụ iche n’icheta ọnwụ ha.

Ụka ncheta ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ ezumezu Gechi dị n’Agụleri n’okpuru ọchịchị Anambra East, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ, malite na ndị ọchịchị, ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu, ndị ndu na ọtụtụ ndị ọzọ, tinyere osote aka na-achị steeti ahụ, bụ Dọkịnta Nkem Okeke, na ode akwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ.

N’okwuchukwu ya na mmemme ahụ, onye ụkọchukwu,John Manafa, kpọkuru ndị otu ‘Christ’ ka ha na-atụkwasị obi n’ebe ha ga-anọ ọnọdụ ikpeazụ ma ha nwụọ, ma gbaa mbọ hụ na ha kwadooro onwe ha ọnọdụ n’eluigwe site n’ibi ezigbo ndụ n’ụwa na ịgbaso ezi mmekọrịta n’etiti ha na mmadụ ibe ha na Chineke. Ọ kọwara di na nwunye ahụ lagoro mmụọ dịka ndị nwere ọtụtụ akụkọ ọma dị iche iche a na-akọ banyere ha, ọ bụnadị n’azụ ha, ma zụlitekwa ụmụ ha n’egwu Chineke, ma kpee ka Chineke gaa n’ihu inye ha ezumike ebighi ebi.

Gọvanọ Obianọ, bụ onye gụpụtakwara akwụkwọ nsọ n’ofufe nrò ahụ kelere imirikiti ndị bịara ụka ahụ maka ịbịa nọnyere ha. Mgbe nke ahụ gachara, o duruziri ha wee gaba n’ili ebe e liri nne na nna ha, bụ ebe ha nọzịrị wee debesie okooko mara mma n’ili ha abụọ ma kpekwazie ekpere ka Chineke nye ha ezumike tọrọ atọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here