Ọnwụ nwakwụkwọ UNIZIK ebutela akụkọ dị iche iche

0
798
Ọnwụ nwakwụkwọ
  • Iwe na ọnụma e ju ụmụakwụkwọ obi

Izunna Okafor dere gere nke a

 

DỊKA a sị na mmadụ nwụọ, akụkọ ya ejupụta ụwà n’ọnụ; akụkọ dị iche iche esochiela ọnwụ obere Maazị Francis Chinedu Mmadubụobi,nwata akwụkwụkwọ Mahadum Nnamdị Azikiwe dị n’Awka azụ, dịka ụmụakwụkwọ mere ngagharị iwe banyere ọnwụ mberede ahụ.

Nwata ahụ, bụ onye a sị na ọ nọ n’ogo nke ikpeazụ ya, ma bụrụkwa onye ọ fọdụụrụ naanị otu ule ka agụmakwụkwọ ya kụrụ ọnụ na mahadum ahụ, wee bụzụrie onye zutere ọnwụ mberede ya n’isi ngwụcha izu ụka gara aga.
Ọnwụ ike ahụ, ihe gbasaara ya, na otu o siri wee mee, bụzị nke mere ka ụmụakwụkwọ niile nọ na mahadum ahụ wee nuputa n’ìgwe mee ngagharị iwe iji gosi na obi adịghị ha mma chaa chaa banyere otu ndị isi ụlọ akwụkwọ ahụ si eleghàra ihe ụfọdụ ha kwesiri ime anya, ọ kachasị ihe metụtara ọnwụ na ndụ.

Na ngagharị iwe ahụ nke weere ọnọdụ ụbọchị Mọnde n’isi ụlọ akwụkwọ ahụ, a hụrụ ụmụakwụkwọ ahụ ka onye ọbụla n’ime ha yicha akwa ojii, zukọọ n’igwè, buru akwụkwọ e dere ihe dị iche iche na nke e sere nwata akwụkwọ ahụ nwụrụ anwụ, wee na-aga okirikiri ime ụlọakwụkwọ ahụ niile na mpụta ya. Ha na-agụkwa egwu iru uju dị iche iche maka ọnwụ nwata ahụ, ma na-agụkwa ụfọdụ egwu ntụfè megide ụlọ akwụkwọ ahụ.

N’ajụjụ ọnụ a gbara ha banyere ụfọdụ egwu ha na-agụ, ihe ha ji eme ngagharị iwe ahụ, na ihe kpatara ọnwụ nwata akwụkwọ ahụ n’ezie, otu onye n’ime ụmụakwụkwọ ahụ, onye kọwara onwe ya dịka Ikenna kọwara na ọnwụ Francis ahụ bụ nnọọ nke kachara wee gbawaa ya obi n’ime ọnwụ niile ọ hụgoro anya n’ụwa a, n’ihi na ọ bụ maka ejighị ihe kpọrọ ihe, ya na adịghị uchu nke ndị ọrụ ahụike na ndị isi ụlọ akwụkwọ ahụ so n’ihe kpatara ọnwụ ya.

N’ịkọwa ihe mere na otu o siri mee, Maazị Ikenna sị na ya onwe ya nọ oge ihe niile ahụ na-eme, ma sị na nke ahụ malitere site n’ọdịda ntụmadu Francis dara n’ogige ebe ha na-akụ egwu ekere-nkata (basketball), nke mezịrị ka ha buru ya ozigbo gaba ụlọ ahụike nke mahadum ahụ dị n’ime ogige ụlọakwụkwọ ahụ, bụkwa ebe ụmụakwụkwọ na-anata ọgwụgwọ n’efù.

Mana mgbe ha rutere ebe ahụ, dịka o siri kọwaa, o nweghị onye dọkịnta ọbụla nọ nso maka ịbịa leru nwata ahụ anya, ebe ụfọdụ ụmụnwaanyị ndị ọrụ ahụike (nurses) nọ ebe ahụ dagburu onwe ha n’ụrụhụ ma bụrụkwa ndị amaghịdị ebe ha ga-ebido ebido, nke mezịrị ka ha gwa ha bụ ụmụakwụkwọ ka ha kpebere onye otu ha ahụ ekpere ka o wee ka dịrị ndụ ruo mgbe dọkịnta ga-abịa, ebe ha onwe ha darakwara ụrụhụ chọbazie ụzọ ha ga-esi kpọ dọkịnta ka o si n’ụlọ gbara bịa. Ha wee malite kpebe ekpere wee na-eche ya bụ dọkịnta, bụ onye a na-amaghị na ọ bụzịkwa n’ụwa a ka o si abịa, ka o si na mpaghara ụwa ọzọ abịa n’ihi ọtụtụ oge o were.

Ọ gara n’ihu kọwaa na ka ha chegidere dọkịnta ahụ ebighị ebi ma ha ahụghị ya, ebe ọnọdụ Francis gakwara n’ihu na-akawanye njọ, ha wee kpebie ozigbo, chọba ka ha ga-esi buru ya gaba nnukwu ụlọ ahụ ike gọọmenti steeti ahụ, ‘Amakụ ; mana dịka Chineke si arụ ọrụ, ya bụ dọkịnta nwaanyị wụchaa n’ebe ahụ ozigbo; ha wee kutuo ume ndụ.

Nke kachazị ntị njọ, dịka o siri kwuo, bụ na dọkịnta ahụ lelechara nwata ahụ wee chọpụta na ahụ ya chọrọ nkùte ume (oxygen), mana dịka ekwensu si arụ ala, ka ha chọchaara elu na ala, o nweghị ọbụnadị otu mkpụrụ akụrụngwa nkùte ume (oxygen) dị n’ụlọ ọgwụ ahụ; ọ bụnadị nke mebiri emebi. Nke ahụ wee bụrụ nnọ nke na-egosi na ụkwa a na-apị, na mkpụrụ adịghị ya, na-agbenyeghị oge niile ha tufugoro n’ụlọ ọgwụ ahụ, ebe nwatakịrị mmadụ jisikwa ike na-agbadà agbadà.

O kwuru na, na-atufughị oge ọzọ, na ha buuru Francis ngwa ngwa wee pụọ, gaba na ya bụ nnukwu ụlọ ọgwụ, Amakụ, mana dịka ha nọ n’ụzọ, nke bụ ebelebe wee gbuo, dịka ahụ ya niile jụrụ nwịị n’ime ụgbọala; mana o nweghị onye kwuputara ihe ọ bụla n’ọnụ ya, wee rukwaa oge ha ruru ụlọ ọgwụ, dọkịnta lelechaa ya ahụ, wee fee n’isi, dịka o kwuru na nwata ahụ ejebela obodo ahụdobe. Ụzụ akwa wee kpọọ.

Otu ọ dị, n’okwu nke ya, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na mahadum UNIZIK, ma bụrụkwa onye na-ahụ maka mgbasa ozi na ya bụ mahadum, bụ Maazị Emmanuel Ojukwu, onye kwuru okwu n’aha ụlọ akwụkwọ ahụ, kwuru na nke bụ eziokwu bụ na nwata ahụ anwụọlarị tupuu ụmụakwụkwọ ibe ya wee buru ya bịa n’ụlọ ahụ ike mahadum ahụ, n’ihi na obì ya adịghị etizị eti, ebe ọbara adịghị agazịkwa n’ahụ ya oge ha buru ya bịa.

Ma ụmụakwụkwọ katọrọ nke ahụ kpamkpam ma kọwaa ya dịka okpookpo asị ọcha, bụ nke ndi isi ụlọakwụkwọ ahụ tụpụtara ka ha wee rafuo ndi ha ga-arafu ma kpuchie nke bụ eziokwu, ebe ha onwe ha ka kwụkwa n’ihe ha kwuru, sị na ọ bụ adịghị uchu na ejighị ihe kpọrọ ihe nke mahadum ahụ ka ha na-ata ụta banyere ọnwụ nwata ahụ, ma kwuo na nke ahụ mere ya ugboro abụọ nwata akwụkwọ mahadum ahụ na-anwụ n’ụdị ọnọdụ ahụ n’ụlọ ahụike ụlọakwụkwọ ahụ.

Ha gara n’ihu jụọ ndị isi ụlọakwụkwọ ahụ ụfọdụ ajụjụ banyere asị ọcha ahụ ha tụrụ, nke gụnyere: kedụ ihe mere ụmụnwaanyị ndị ọrụ nlekọta ahụ ike nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ jiri sị ha kpebere nwata ahụ ekpere ka ọ ka dị ndụ wee ruo mgbe dọkịnta ga-abịa, ebe ha sị na ọ nwụọla tupuu ha buru ya bịa?

Kedụ ihe dọkịnta ahụ jizị achọ akụrụngwa nkùte ume (oxygen) ebe ha sị na nwata ahụ anwụọla?
Kedụkwa ihe mere ha bụ ndị ọrụ ahụ jiri kwuo ka e buru nwata ahụ gaba nnukwu ụlọ ọgwụ, karịa ikwu ka e buru ya gaba n’ụlọ nchekwa ozu (mortuary), ebe ha kwuru na ọ nwụọla?

N’ihi nghọtahie ahụ na ihe ndị ọzọ na-esochi ọnwụ nwata ahụ azụ, Maazị Emma Ojukwu gara n’ihu mee ka a mara na mahadum ahụ eguzobela otu nnyocha pụrụ iche maka ileba anya n’ọnọdụ, otu o siri nwụọ, na ihe gbasaara ọnwụ nwata ahụ.

Mana ụmụakwụkọ kọwakwara otu ahụ dịka nke enweghị isi na ọdụ n’ihi na: nke mbụ, e meghị ka ọhaneze mara mgbe a na-atụ anya na ndị otu a ga-ewepụta mpụtàrà nnyocha ha; nke abụọ, ndị otu ahụ enweghị akụrụngwa bụ ịgba ha ga-eji mee ya bụ nnyocha, beere sọ ma ha ọ ga-agba afa (ebe ha enweghị ike idebenwu ọbụnadị otu akụrụngwa nkùte ume, bụ oxygen n’ụlọ ọgwụ ha). Ọzọ kwa, ụmụakwụkwọ ahụ kwuru na o nweghị uru ọbụla mpụtara nnyocha ahụ ga-aba, ebe ọ bụ na Francis anwụọla anwụ, ebe a ga-akakwara ya ụka onye nwụrụ anwụ ụbọchị Frayịdee na-abịa abịa na Garụba Square dị n’ime ụlọ akwụkwọ ahụ.

Ha gazịrị n’ihu kpọkuo isi ọchịchị ụlọakwụkwọ ahụ ka ha were oge ha na akụ na ụba ha mere ihe bara uru, chọọ ka ha ga-esi gbochie ụdị ihe ahụ ka ọ gharazie ime n’ọdịnihu, nye ndị ọrụ ahụike ha ezigbo ọzụzụ, ma kwalitekwa akụrụngwa ụlọ ahụike ahụ, karịa ịgọ agụgọ na aka ha dị ọcha, na imefusi ego n’ihe enweghị isi na ọdụ, n’ụdị ime nnyocha oge Francis jiri wee nwụọ.
Ha kpezịkwara ekpere ka mkpụrụ obi ya bụ nwa amadi zuo ike na ndokwa.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here