Ichọ mma n’agba ọfụụ

0
792
Ichọ mma

Chinwendu Uzoatu dere nke a

 

ICHỌ mma bụ ọdịbara gboo. Mgbe elu bụ ala ọsa ma ụmụnwanyị ma ụmụnwoke na-achọ mma n’ihi na mmadụ kwesiri ịma mma.

Ọ bụ eziokwu na ụmụnwoke na-achọ mma mana dịka anyị maara, ọ bụ ụmụnwanyị bụ isi a hụrụ kwaa okpu n’ihe gbasara ịchọ mma.

N’oge mbụ, ụmụnwoke na-achọ mma site n’ịkpụ isi na ịkpụ afụọnụ ma debekwa onwe ha ọcha. Ha na-eyi ụdị akwa dị iche iche iji wee dị mma.

N’otu ka ahụkwa, ụmụnwanyị n’oge gboo na-achọkwa mma n’ebe ọdị ukwuu. Ha na-ede uri, na-ete uhie, na-akpa ọtanjele tinyekwara iyi jigida, aka, nja, ọla dị iche iche ma nọdụkwa n’elu ya ji achọ mma dịcha mma makana ha enweghị ọghọm ọbụna n’ebe mmadụ nọ.

Abịa n’oge ugbua, ụmụnwoke na-achọzi mma ka ụmụnwanyị. Ọtụtụ n’ime ha na-eghezi isi ha eghe, ntutu isi na afụọnụ ha nke na-emezi ka ntutu isi ha na afụọnụ ha dizie ka aji anụmanụ.

Ha na-akwazi iyeri ntị ma na-akpakwa isi, nọdụkwa n’elu ya na-ete uri ọnụ. Ọ bụ gịnị ka a ga-akpọ nke a?

N’akụkụ nke ụmụnwanyị n’oge a, ite adịghịkwa ebe e sinyere ya n’ihi na mmiri na-achozi ịna gari. Otu nwoke kwuru si na ebe Chineke emetaghị ụmụnwanyị onweghị onye ga-emeta ha. O kwuru sị na Chineke nyere ha iku anya ha akpụchapụ ya kaa nke ha, o nyere ha mbọ ha e bepụ ya tinye nke ha, o nyere ha ntụtụ isi ha kpụchapụkwara ya tinye nke ha, o nyekwara ha ara mana ha na-ekechi ya n’otu ọ bụna ha chọrọ ka ọ hara n’ibu, otu aka ahụkwa, o nyere ha egbugbere ọnụ mana ụtụtụ ọbụna ha etee uri ọnụ dị iche iche na ya. Akụkọ nwoke a agbaala ihe nile n’anwụ. Ichọ mma ụmụnwanyị n’oge ugbua na-agafezi oke.

GUO:  Ihe ụmụnwaanyị ji achọ mma mgbe ochie

Ụfọdụ na-eyizi akwa ka ndị ara ebe ụfọdụ na-eyi ka ndị akwụna n’ihi ichọ mma. Ihe kacha njọ n’ụfọdụ ụzọ ha si achọ mma ugbua bụ na ọ na-ebute nsogbu dị iche iche dịka ọrịa, nsogbu anya wdg. Kedu ka mmadụ ga-esi mara na ihe ọ na-eme adighị mma ma gaa n’ihu na-eme ya?

Otu o sila dị, o nwere ndị a gbara ajụjụ ọnụ n’isiokwu a. Ha kwuru ọghọm dị iche iche dị n’ịchọ mma n’oge ugbua.

Oriaku Chizoba Onyeyiri bụ onye nwee ọdụ ebe a na-achọ mma ‘beauty salon’ na njikọ ụzọ ‘green tower’ Awka kwuru na ụfọdụ pọuda ụmụnwanyị na-ete nwere nnukwu ọghọm. O kwuru na ha na-ebute ihu mmadụ ịdọlịkọ ma na-aka nka n’ike.

Abịa n’ihe gbasara nke a na-agbakwunye n’anya o kwuru na ọ dị ụzọ abụọ; nke a na-amado na okpuru anya kpọmkwem, nke na-eme ka anya ụfọdụ ụmụnwanyị dịka anya nwamba, na nke a na-amado na mpupe anya. Ọ kọwara na nke ahụ a na-amado na mkpụrụ anya ‘eye contact’ na-ebute nsogbu anya n’ihi na ọ bụ n’ime mkpụrụ anya ka a na-amado ya ebe nke a na-amado na mpepe anya ‘eye lash’ na-adọchapụ mpupe anya nke Chineke nyere mmadụ nke nwere ihe ọ na-arụ.

  Oriaku Chizoba kwuru n’ime ihe nile na mmiri ‘chemical’ na-enye nsogbu dị egwu na ahụ mmadụ. Ọ bụ ya ka e jiri rụọ ihe ndị a e ji amado ihe n’anya tinyekwara ọtụtụ pọụda.

 

Nke a na-aba n’ime anya ma na-ebutejwa ọghọm.Ọ gakwara n’ihu kwuo na otu ude na-acha mmadụ ọcha si akpa ke n’ahụ ka ọtụtụ pọụda ndị ahụ a na-anya si akpa ike ọjọọ n’ihi na ọ bụ mmiri ‘chemical’ ka e jikwara rụọ ya.

GUO:  Ihe ụmụnwaanyị ji achọ mma mgbe ochie

Dịka onye ọlụ ichọ mma doro anya ma bụrụkwa onye maara ihe ekwe na-akụ o nyere ndụmọdụ ka ndị mmadụ na-ete pọụda ọcha ‘white powder’ n’ihi na dịka o kwuru, nke a na-eme ka ihu mmadụ na-adịwanya nwata karịa nke ọzọ na-aka mmadụ nka n’ike. O kwuru na ọ bụ pọụda ahụ na-akpa ike ọjọọ n’ahụ mmadụ na-eme ka ụfọdụ ụmụnwanyị dọliịa ihu.

 

Ọ rụtụkwaziri aka na mbọ nke a na-akwunwe n’aka na ukwu. O kwuru na nke a na-emebi mbọ nke Chineke kere site n’ịdọchapụ ya ma mere ka ọ tarie. Ọ sịrị na ọ bụ mmiri ‘chemical’ ahụ e ji amado ya na-akpata nke a.

Ọ kọwakwara na ọtụtụ ndị ọlụ ha bụ ite ndị mmadụ etemete ‘make up artiste’ anaghị ete ihe ndị ahụ. Otu a ka nkata anyị nay a siri ga, onye nwere ntị ya nụrụ.

 

Oriaku Oby Mmuo, onye ọlụ n’akwụkwọ akụkọ ‘National Light’ gbarụrụ ihe maka otu ụmụnwanyị ugbua si achọ mma. Nke kacha wee ya iwe ma ruo ya n’ọkpụkpụ bụ mma nke ha na-achọ n’anya. O kwuru sin a ọ dịghị mma mmadụ iji anya ya egwu egwu n’ihi na anya bara nnukwu uru na ndụ mmadụ. O kwuru si, “Anya a Chineke kere eke, were ya sọọrọ ya nsọ.”

 

Ọ gara n’ihu kọwaa ka o si adụ ụmụaka nwanyị bụ ndị ji anya ha egwu egwu n’ụzọ dị otu a ndụmọdụ ka ha kpachara anya ha maka na ngara mara n’ikpe azụ.

O wee bụrụ ya ọtụtụ ọghọ m dị n’ichọ mma n’oge ugbua. Otu nwoke gbara nwunye ya alụkwaghị m n’ihi na ụbọchị ga-abụ chi ya fo ha agbaa akwụkwọ ka nwunye ya jere ịchọ mma, mmiri ‘chemical’ bara ya anya, o kpọọ nwoke ahụ wee ju ya, agbamakwụkwọ kwasaa. Ọ bụ onye ka ikpe mara, nwoke ọ bụ nwanyị?

GUO:  Ihe ụmụnwaanyị ji achọ mma mgbe ochie

 

O kwesiri ka mmadụ Chineke kere eke mara ihe. Mmadụ kwesiri ichọ mma n’ụzọ dị mma. Onye ọ bụna gbaara ichọ mma nke na-ebute ọghọm ọsọ ka ofe rọrọ arọ wee zuoro ya nri.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here