Chinwendu Uzoatu dere nke a
IRU mgbede bụ mmemme ndị Igbo na-emere ụmụ ha ndị nwanyị mgbe ha tozuru agbọghọbịa ma rukwa ogo ịlụ di. A na-eme nke a dịka obodo si dị.
Emume mgbede bụ oge nne na nna ji akwụghachi nwa ha nwanyị ụgwọ ọlụ ọma nile ọ lụụrụ ha n’ezinaụlọ. Nke a bụkwa oge e ji agba ya ume maka agwa ọma ọ kpara dịka nwagbọghọ. N’oge emume a, ọdịghị ozi ọ bụna nwagbọghọ a ga na-aga. Ọlụ ya ugbu a bụ nanị iri nri a kwọrọ aka wee sie, ịchọ onwe ya mma, igwuri egwu na izu ike. Nne ya gaa ahịa, ọ zụkọta anụ na azụ ọ ga na-esiri ya, makana nri ọ na-eri n’oge a ga na-abụ nke juputara n’anụ na azụ.
Ọ bụ eziokwu na ndị Igbo na-eme emume mgbede iji gosi obi ụtọ ha n’ebe nwa ha nwanyị nọ, ma o nwekwara ebumnuche ndị ọzọ e ji eme ya.
Nne na nna ji oge a agwa ọha na eze na ada ha eruola ogo ịlụ di. Mgbe e ruchara mgbede, ụmụ agbọghọ ndị nwegoro di na-ala be di ha. Ọ bụkwa ohere ndị enwebeghị di ji enweta.
A na-esitekwa n’iru mgbede zụọ nwagbọghọ nke ọma maka ibi ndụ ezinaụlọ. Nke a na-enyere ya aka nke ukwu oge ọ lara na be di ya.
Iru mgbede na-enyere ụmụ agbọghọ aka ịlụ di ọsọọsọ makana ọ na-eme ka ha mmaa mma, chapụ achapụ ma na-amakwa poko poko.
Ka o sila dị, emume iru mgbede a naghị apụtakwa ihe na ndụ ndị Igbo ugbu a. Ọbịbịa ndị bekee (ndị ọcha) so n’ihe mebiri ya. N’ihi mgbanwe so ọbibịa ha, ụmụ agbọghọ malitere gụba akwụkwọ. Nke a mere na e nweghịzị ohere maka iru mgbede.
Ndị ụka ewegharala nkuzi maka ụmụ agbọghọ ila be di ha nke mere ka iru mgbede laa azụ.
Ihe ndị ọzọ mere ka a kwụsi emume iru mgbede bụ, oke ihe isi ike, ụmụaka ugbu a anaghịkwa alụ ọlụ siri ike nke mere na ọdighizi mkpa iwepụtara ha oge maka ezumike.
N’ikpeazụ, ọtụtụ ụmụ agbọghọ ka ọ dị ugbu a anaghị enwekwa ike ijide onwe ha ka ha ghara inwe mmekọ nwoke na nwanyị tupu ha alụọ di.
Nke a dị nnukwu mkpa maka emume iru mgbede. Ọ bụ nanị ụmụ agbọghọ ndị amaghị nwoke ka a na-emere emume iru mgbede.
Nke a dabara adaba. Jisie ike Odee.