Ịtụ ime mkpuke na nsogbu so ya

0
1004
ime mkpuke

Uchenwa Mba dere nke a

 

AFỌIME bụ ezi ihe ma nwanyị tụrụ ime n’ụzọ ziri ezi. Ụzọ ziri ezi bụ mgbe nwagbọhọ nwere di, baa n’ezinaụlọ nke ya. Ọ dị ime mgbe ahụ, nne, nna na ụmụnne ya añụrịa. Ndị ezinaụlọ ya a na-eme ngala na nwa ha dị ime. Nne ya a na-ejikere ịga ọmụgwọ, di ya na ndị hụrụ ya n’anya a na-agbara ya mbọ ma na-ejekwara ya ozi. Obi a na-atọ ya ụtọ na-aga amụpụta nwa.

 

Mana ọ bụrụ na nwagbọghọ enweghị di wee dị ime, nke mbụ bụ na o weteere onwe ya aha adịghị mma. Ọzọ, ezinaụlọ ya agaghị enwe nkwuwa okwu n’ama.

Ọ bụ ezie na nwa bụ ezi ihe mana ọ bụrụ na nwagbọghọ enweghị di wee dị ime, ọ dịzie ka nwa ahụ a ga-amụ ọ bu ihe ọjọọ. Ụfọdụ mmadụ anaghị eche ihe ha ga-ekwu asi na-azụghị nwagbọghọ ahụ azụ. Ụfọdụ asi na oyiri nne ya ma ọ bụ nna ya, ebe ụfọdụ ga-asị na ọ bụ nne nne ya ka o yiri. Okwu ndị a nile a na-agwa nne na nna ahụ bụ maka nzọhie ụkwụ ahụ nwagbọghọ ahụ zọhiere.

 

Ụfọdụ ndị na-ekwugide ya mere ihe ka nke nwa ahụ mere wee dị ime ahụ, mana  ha adịghi ime ma ọ bụ na ha wepụrụ nke ha.

Okwesiri ka nwagbọghọ ọ bụla mara onwe ya, ghara ịtụrụ ime mgbe ọ ka enweghị di, ka ihe ọma ghara ị bụrụ ya ijhe ọjọọ.

 

Ihe jọgbụrụ onwe ya n’okwu a bụ na ụmụnwoke na-atụba ụmụagbọghọ ime ahụ na-agọnari ha, nwagbọghọ na ndị ezinaụlọ ya atabazia ahụhụ dị na ya sọ ha.

Ọ bụrụ n’ezinaụlọ enweghị ka ọ ha ha, nwagbọghọ ahụ ahusie anya n’ihi na ha bara n’ihe ha etorughị. Ha a naghị enwe akwa kwesịrị na ha ga-eyi n’afọime, ha adịghị eri ihe gụrụ ha. Ọ bụrụ na ha na-enwe nsogbụ ahụike, ha agaghị enwe ike ịgwa mmadụ.

 

Ụfọdụ, n’ihi ihere, ọ na-ezogharị rue mgbe ọ ga-amụ nwa. Nsogbu ọzọ bụ na nwagbọghọ tụrụ ime mgbe ọ gụchabeghị akwụkwọ, ọ gaghị enwekwa ohere ịlachigha azụ n’ụlọakwụkwọ.

Otu nwanyị, aha ya bụ Edna Okafor, n’okwu ya, kwuru na nwagbọghọ ịtụrụ ime mkpuke dịka ndị Igbo si akpọ ya bụ nọọ ihe na adịghị mma chaa. “Ihe na-ebute nkea bụ enwghị egwu Chineke maka na Chukwu nyere ndụmọdụ a n’akwụkwọ Galetia isi nke isii, usoro nke iri na iteghete; “ọ bụrụ na ha nwere egwu Chineke ma nwoke ma nwanyị na-ebị ndụ dị otu a ga akwụsị ya”.

 

O kwuru n’ezie na nwagbọghọ ịtụrụ ime mgbe o nwegbeghị di bụ oke ihe mmekpa ahụ dịrị ezinaụlọ ọ bụla ọdabaara, ọkachasi ọ bụrụ na ọ mụọ nwa nwoke.

Ọzọ, ọ na ewetara ezinaụlọ ihere. Ọ bụrụ na ụmụagbọghọ na-echeta aha ọjọọ ha ga esite na nke a wetara ezinaụlọ ha, ha ga-agbanarị okwu ụfọdụ ahụ ụmụnwoke na-adi agwa ha.

 

Odoziaku Edna kwuru ka ụmụagbọghọ nile kpachapụ anya ha ka ha ghara iweda onwe ha n’ala site na ị gakwuru nwoke n’ihi na ngwangwa ọtụụrụ ime, ọgọnarị ya, ọ taba ahụhụ nani ya.

Ụmụagbọghọ kwesiri ịmata na nwa ahụ ha ga-amụ ga-ajụ ha ase nna ha ma o too. Ọ bụrụ na e gosighị ya nna ya, ọ ga na-enwe nwute n’ime onwe ya. Ụfọdụ n’ime ụmụgbọghọ chere na ha mara ihe, ha tụrụ ime, ha eje wepụ ya. Ụfọdụ esi ebe ahụ laa mmụọ.

 

N’ihe gbasara ọlụ nne na nna ebe ụmụ ha nọ, ọkachasi ndị nwanyị, Odoziakụ Okafor kwuru na ọtụtụ ndị nne na nna na-agba mbọ ịdụ ụmụ ha ọkachasi ndị nwanyị mana ọgbọ a enweghị nti e ji anụ okwu ndị mụrụ ha na-agwa ha.

 

Ọ gara n’ihu kwuo maka otu ezinaụlọ ya maara nke ọma mgbe nwa ha nwanyị na-enye nsogbu. O kwuru na nwanyị ahụ na-eti nwa ahụ ihe. Oge ụfọdụ, ọ kpụcha ya isi, oge ụfọdụ, ọ kpochie ya n’ụlọ mana ngwa ngwa okpopeere ya ụzọ, ọ gakwuru nke nwoke ebe ọbụla ọ nọ.

 

Odoziaku Edna nyere ụmụagbọghọ ndụmọdụ ka ha biko gbanari ụdị ndụ ahụ ga-eme ka ha tụrụ ime mgbe ha aka enweghị di.Ọ gakwara n’ihu rịọ gọọmentị ka ha biko mara ka ha ga esi na-enyere ụmụagbọghọ na ụmụ ha n’amụ aka ka ahụhụ na ebeleta n’ala anyị.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here