Ụka Katolik e chiela mmadụ iri na atọ ụkọchukwu n’Awka

0
765
Ndị ụkọchukwu

Chinwendu Uzoatu dere akụko

 

Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ na ‘St Patrick’s Cathedral, Awka’ na Satọdee gara aga, ebe a nọrọ chie ụmụokorobia iri na atọ ụkọchukwu.

 

Ọ bụ bishọọpụ ụka katọlik nke dayọsis Awka, ‘Most Rev. Dr’. Paulinus Ezeokafor chiri ha echichi ụkọchukwu.

Ọtụtụ ndị mmadụ bịara mmemme a nke gụnyere Bishọọpụ Ayo-Maria Atoyebi, nke Dayọsis Ilorin, tinyekwara Bishọọpụ Manfred Schever na ndị na-agụ akwụkwọ maka ịbụ ụkọchukwu(seminarians), bụ ndị si obodo oyibo; Dayọsis nke Linz, Austria wee wụchaa.

 

Bishọọpụ Schever a dịgorịị na mbụ, chie mmadụ abụọ ndị dayọsis Awka ụkọchukwu n’ụlọụka ‘Immaculate Conception Cathedral, Linz, Austria,’ ka ọnwa June dị na mkpụrụụbọchị iri abụọ na iteghete.

Aka na-achị Anambra Steeti bụ Chief Willie Obianọ (Akpokuedike) nọ ya tinyekwara ndị si n’obi gọọmentị na ọtụtụ ndị mmadụ e ji okwu ha agba izu.

 

N’okwuchukwu, Bishọọpụ Ezeokafor gwara ndị a e chiri ụkọchukwu na Chineke ga-edu ha, na sọ ihe ọ chọrọ n’aka ha bụ irube isi.

Ọ gwara ha sị, “unu bụzi ọkara mmadụ, ọkara mmụọ. Unu ga-abụ ihe. Keenụ ajị n’ume. Mberede nyịrị dike mana mberede ka e ji ama dike. Ndị ụkọchukwu dị mma, ndị ụka adị mma.”

 

“Ụtọ ndụ bụ uru ị baara onye ọzọ. Ma fada, ndị nkuzi, dibia oyibo ma gọvanọ, ụtọ ya bụ mmadụ ole ị nyeere aka.”

Ọ gakwara n’ihu dọọ ndị mmadụ aka na ntị gbasara ndị amụma ụgha.

Gọvanọ Obiano kelere mmadụ nile ma ñụrikwaara ndị ụkọchukwu e chiri ọhụrụ na ndị ezinaụlọ ha. O kwuru si “ọ bụ mmọnwụ ka e tiri unu taa n’ihi na dịka bishọọpụ siri kwu, unu bụzị ọkara mmadụ ọkara mmụọ.”

GUO:  Ndị mmadụ ka na-akwa arịrị ogbugbu ndị ụkọchukwu na ndị ọzọ na Benue

 

“Unu ga-abụ ndị nche atụrụ, ọbụghị agụ owuru. Werenu egwu Chineke lụọ ọlụ, ihe ndị ọzọ ga-abụ nke unu.”

 

Gọvanọ gakwara n’ihu nabata Bishọọpụ Linz, Austria dịka ọ bịara Awka.

Gọvanọ Obianọ dụkwara ndị nne na nna ọdụ ka ha na-akwado ụmụ ha maka ichi echichi ụka.

Otu n’ime ndị ụkọchukwu e chiri ọhụrụ bụ ‘Rev Fr’. Bona Ofolete, nke si ‘Holy Name Parish, Umuchu,’ mgbe ọ na-agọzi Gọvanọ Obianọ, hafere Anambra steeti n’aka Chineke.

 

Ihe ndị pụtakarichara ihe e mere na echichi ụkọchukwu ahụ bụ; ikwe nkwa irube isi, ịkpọkụ ndị nsọ (mgbe ndị ụkọchukwu ahụ mara afọ n’ala) iyinye akwa ụkọchukwu, ite ude.

Ndị mmadụ si obodo dị iche iche na dayọsis Awka wee bịa, soro ụmụ ha ñụrịa.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here