2019: APGA ga-ewepụta onye ga-azọ ọkwa onyeisi ala

0
640
APGA-2019-Presidential

Izunna Okafor

 

DỊKA nhọpụta izugbe nke ahọ 2018 n’ala Nigeria na-akpụdobe nso, isi ọchịchị otu ndọrọ ndọrọ ‘All Progressive Grand Alliance’ (APGA) emeela ka a mara na ha ga-eweputa onye ga-eji aha otu ndọrọ ndọrọ ahụ wee zọọ ọkwa onyeisi ala.

Isi ọchịchị otu a mere ka a mara nke a n’ọgbakọ pụrụ iche ha nwere n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma sịkwa na onye nke ga-azọ ọkwa onyeisi ala ga-esite mpaghara mgbago ugwu ala anyị, ebe osote ya ga-esite mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ. Dịka ozi na nkwekọrịta e mere na mmemme ahụ siri kwuo, a nọrọ na ya bụ mmemme wee kpaa banyere ọdịnihu na ọdịmma nke otu ndọrọ ndọrọ ahụ, tụọ aro pụrụ iche maka nhọpụta izugbe na-abịa abịa nakwa nhọrọ na ihe ndị ọzọ cheere ha n’ihu.

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ka ọgbakọ ahụ gachara, ode akwụkwkọ isi ọchịchị otu ahụ, bụ Alhaji Sani Shinkafi mere ka a mara na ọ bụ ka ha tụlechaara ọtụtụ ihe banyere nhọpụta izugbe ahụ ka ha jiri wee kpebie na ọ ga-amagbu onwe ya ma ha weputa mmadu abụọ sitere mpaghara mgbago ugwu na mpaghara ndịda-ọwụwa anya ka ha zọọ ọkwa onyeisi ala na osote onyeisi ala n’otu.

O mere ka a mara na nsogbu na kata-kata ahụ na-ebigasị otu ndọrọ ndọrọ PDP na APC aka ọjọọ ugbu a, ga-eme ka ụmụafọ ala Nigeria chọọ otu ndọrọ ndọrọ ọzọ kacha mma, ma bụrụkwa nke nwere ezi mmetụta ụmụ mmadụ n’obi.

Maazị Shinkafi gara n’ihu mee ka a mara na otu ndọrọ ndọrọ ahụ adịghị apụta ịzọ ọkwa onyeisi ala ka ụwa wee hụ ya ma ọ bụ ka e wee sịchakwaa; kama na ọ bụ n’ihi na ha ghọtara ọnọdụ ala Nigeria nọ n’ime ya ugbu a, bụzị nke mere ha jiri kpebie iweputa ndị tozuru oke ma nwekwa ihe a chọrọ iji gbanwee ọnọdụ ala anyị.

GUO:  Gaanụ n'ihu na-ịkwàdo APGA – Obiano arịọ ndị Anambra

Ọ kpọkuzịkwara ọhaneze ka ha gaa n’ihu n’inye otu ndọrọ ndọrọ ahụ nkwàdo zuru okè iji mee ka ezi ebumnobi ya pụtawanye ihè karịa ka ọ dị ugbu a, ọ bụnadị dịka ọ rụtụrụ steeti Anambra aka dịka ebe nlegara anya.

 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here