A dụọla ụmụakwụkwọ ka ha na-akwàlite njirimara Igbo

0
742
njirimara Igbo

Izunna Okafor

 

E MEELA ka a mara mkpa ọ dị ịkwàlite njirimara na omenala ndị Igbo, ọ kachasị n’etiti ụmụakwụkwọ.

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nyere ọkpụkpọ oku a n’otu nnukwu mmemme a chịkọbara site n’aka ndị otu jikọtara ụmụakwụkwọ niile bụ ndị steeti Anambra, bụkwa nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka.

N’okwu ya na mmemme ahụ, Gọvanọ Willie Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nyere ya n’ihe gbasaara iwulite ndị ntorobịa na ọrụaka n’usoro ọgbara ọhụụ digitalụ, bụ Maazị Ifeanyị Anịagọ, mere ka a mara na ọ dị mkpa ka mmadụ ọbụla na-echeta ebe o si oge niile, ma na-agbasikwa mbọ ike ịkwàdò njirimara obodo ya.

Ọ gara n’ihu kpọkuo ụmụakwụkwọ steeti ahụ nọ n’ogoogo dị iche iche, ọ kachasị ndị nọ n’ogo mahadum n’ebe dị iche iche, ma dụọ ha ka ha ghàra iji maka na ha nọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu wee gbakụta asụsụ, ejiji na omenala ndị Igbo azụ.

O mekwara ka ha mara nzọpụ ụkwụ dike na ịgba dị iche iche dagoro ụda nke ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ tigoro na ngalaba mmụta, ihe dị iche iche ọ kwàdooro ụmụ akwụkwọ nakwa otu ụmụakwụkwọ sitere steeti ahụ si eme ka ihu ọchị waa steeti ahụ site n’ituru ugo n’ule na asọmpi dị iche iche n’ala Naịjiria nakwa na mba ofesi.

Ọ kpọkuzịkwara onye ọbụla n’ime ha ka o jisie ike n’agụmakwụkwọ ya n’ihi na onye ọbụla mere nke ọma n’ịgụ akwụkwọ ya nwere ụgwọ ọrụ dị oke elu, ma dụọ ha ka ha ghara ikwe ka ihe dị iche iche na-eme n’ụlọ akwụkwọ dị elu rafuo ha.

N’aka nke ọzọkwa, otu onye n’ime ndị sonyere na ya bụ oke mmemme, bụ Maazị Abụchi Ọnwụmere, bụkwa onye nta akụkọ na-ewu ewù  kpọkuru ụmụakwụkwọ ka ha cheta na onye kpọọ ọba ya ọkpọkọrọ, agbataobi ewere ya kpoo ntụ, ma dụọ ha ka ha na-echeta ebe ha sìrì pụta oge niile.

Ya bụ nwa amadi na-arụ n’ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ FIDES dị n’Awka ma bụrụkwa onye e nyere onyinye nkwanye ugwu pụrụ iche site n’aka ụmụakwụkwọ na mmemme ahụ, kwara arịrị otu ndị mmadụ si agbakụta ndị nta akụkọ azụ ma ghara ịdị na-enye ha nkwàdo kwesiri ekwesi na-agbanyeghị mbọ dị iche iche na ntụnye pụrụ iche ha na-eme na mmepe obodo.

Ọ gazịrị n’ihu kpọkuo ndị ji ọkwa ọchịchị na ndị ọzọ selitere isi na ngalaba dị iche iche ka ha ghọta mkpa ọ dị ichetà na ịkwàdo ndị nta akụkọ oge niile ma mee ka obi dị ha mma, ọ bụnadị dịka ụmụakwụkwọ ahụ chetara ọrụ ọma ya niile nyere ha n’ihe gbasaara mgbasa ozi banyere ihe ọbụla ha na-eme, wee nye ya nkwanya ugwu ahụ

Na mbụ n’ozi nnọọ ya, onyeisi ndị otu ahụ, bụ Maazị Echegwo Godwin mere ka a mara na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji gosipụta ịma mma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo, ma kpọkuziekwa ụmụakwụkwọ ibe ya ka ha tinye ihe ọbụla ha nụtara na mmemme ahụ n’ọrụ ma were ha kpọrọ ihe.

Ndị ọzọ sonyere na ya bụ oke mmemme gụnyere Maazị Godwin Madụka, bụ nwaafọ steeti Anambra ma bụrụkwa onye ọrụ ahụike na-ewu ewù na mba ụwa, biri na mba USA; Onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra etiti n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu sineeti, bụ Maazị Victor Umeh; eze ọdịnala Ogidi, bụ Igwe Alex Uzo Onyido, na imirikiti ndị ọzọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here