A kpọọla oku ka a rụchapụ ụzọ dị iche iche n’Anambra

0
522
ụzọ Anambra

Izunna Okafor

A KPỌKUOLA aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ ka ọ nye ntụzi aka ka ụlọ ọrụ ngo ji okporo ụzọ dị iche iche na steeti ahụ mee ngwa ngwa rụchapụ ya n’ihi ajọ ọnọdụ nke ahụ na-eweta.

Oku a bụ nke a kpọrọ site n’ọnụ ndị omebe iwu steeti Anambra n’isi ngwụcha izuụka gara aga dịka ndị otu ahụ nwere ọgbakọ ha n’Awka.

N’okwu ya n’ọgbakọ ahụ, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Ọgbaru nke mbụ n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu ahụ, bụ Maazị Benson Nwawulu kpọkuru ya bụ aka na-achị achị ka o mee ka onye ji ọrụ ụzọ G.M.O. Ogbuagu-Mgbuka-Amaizu dị uchu n’ọlụ ya . Maazị Nwawulu kpọrọ oku a dịka ọ kwara arịrị otu idè mmiri siri gbàgbuo ụmụaka atọ nso nso a n’Okpoko, ma mee ka a mara na e kwesiri ịkapị ọrụ ahụ ọnụ ngwa ngwa iji gbochie ụdị ihe ize ndụ ahụ ịdapụtakwa ọzọ.

N’okwu dịkwa ka ya, onye nke na-anọchite anya Orumba Nọọtụ n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu ahụ, bụ Maazị Romanus Obi nọkwara n’ọgbakọ ahụ kpọkuokwa Gọvanọ Obianọ ka o nye onye ọrụ ngo ahụ ji ọrụ okporo ụzọ Awgbu-Amaetiti-Ufuma- Ndiukwuenu-Awa ka o mee ngwa ngwa rụchapụ ya bụ okporo ụzọ n’ihi ajọ ọnọdụ dị iche iche nke ahụ na-eweta nakwa otu o sigoro mee ka ụzọ ahụ bụrụzie agaghị aga.

 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here