Akụlueunọ dị oke mkpa n’Anambra

0
528
Akụlueunọ

Chinwendu Uzoatu

 

AKA na-achị steeti Anambra bụ Chief Willie Obiano,ọtụtụ oge, akpọkuela ụmụ Anambra ka ha leruo anya n’ụlọ. Ọ bụ nke a ka o jiri hiwe isiokwu nke ọ kpọrọ ‘Akulueụlọ’.

Ọ bụrụ n’anyị tụlee ya, anyị ga-aghọta na steeti a bụ Anambra bụ steeti Chineke ji ọtụtụ ihe wee chọọ mma, nke bụ na ndị nọ na ya anaghị achọ ihe ọma achọ na ndụ ha.

Abịa n’ọlụugbo, Anambra bụ eji ama atụ. Chineke gọziri ala anyị nke bụ na ihe a kọrọ n’ubi na-eme eme. Anambra na-alụpụta ihe dị iche iche site n’ịkọ ọlụ. Ka ọ dị ugbua, e jizi osikapa wee mara steeti a, e nwere osikapa Anambra,osikapa Coscharis,osikapa Naira,osikapa Ihiala wdg.

E wezụgakwa osikapa, Anambra na-akọkwa akpụ, ji, akwụkwọ nri na ọtụtụ erimeri ndị ọzọ.

Abịakwa n’ikpa ụmụanụmanụ dịka ọkụkụ, Anambra nwere ọtụtụ ụlọọlụ na-eme nke a nke bụ agụkata agba awaa.

A bịa n’ọlụaka, nke bụ ihe e ji aka alụpụta, a ga akpọ Anambra ‘Japan’ nke Afrika n’ihi na ha na-agbo ihe ewu na-eri. Akụrụngwa ụgbọala nke adịghịkwa n’ahịa, ị bịa n’Anambra, a ga-alụpụta ya, tinyere gị n’ụgbọala gị. Ndị steeti a na-alụ ọluaka n’ụzọ dị iche iche.

Steeti Anambra nwere ahịa dị iche iche nke nọ n’ogo dị elu nke mba ụwa na-abịa a zụrụ ahịa. Ahịa ndị dịka ‘Onitsha Main Market’, Nkwo Nnewi, Eke Awka w.d.g. Ahịa ndịa na ọtụtụ ahịa ndị ọzọ juru na steeti a bụ ebe mmadụ na-azụ ma na-erekwa ihe e ji enyere ndụ aka.

Ọ bụ gini ga-eme na ụmụ steeti a agaghị abịa, lọta n’ụlọ, wee soro kpara ya bụ oji nkụ. Ihe nile juru n’Anambra bụ nke Chineke nyere anyị maka ọdị mma nke anyị.

Ọtụtụ oge ka ụmụ steeti a na-alụcha ụlọ n’ugwu Awụsa, echi, ịnụ na a kụturu ụlọ ha n’ihi na ha abụghị ndị agbụrụ ahụ. Ihe dị otu a adịghị mma nti ịnụ ya, ebe ala juru eju ma bụrụ atụrụ taba na steeti Anambra. Ana m akwadosi ike ka ụmụ Anambra na-agba ala ma na-alụ ihe ọbụna ha chọrọ ịlụ na steeti a n’ihi na ebe a bụ ala nke onye ahụ so nwere. Mgbe ị na-eme ihe dị otu a, ka ị na-enye aka na-emepe obodo gị.

Ụfọdụ ndị Anambra na-aga na steeti ndi mepechara emepe kemgbe na-alụnye ụlọ ọlụ na-emepụta ngwa ahịa. Nke a bụ mmadụ I kuru mmanụ ọkụ na-awụnye n’ọkụ na-ere ere.

Ọ bụrụ na mmadụ lọta obodo ya rụọ ụlọọlụ na-emepụta ngwa ahịa, ọ ga-esikwa n’ụzọ dị otu a nye ọtụtụ ndị obodo a ọlụ ma mepekwaa ya.

Onye ọbụna nwere ọgụgụ isi maara na akụ nke o weletara ụlọ bụ nke o ji n’ihi na ọ bụ nke ahụ dị na be ya.

Gọvanọ Chukwuemeka Ezeife (Okwadike Igboukwu) wepụtara amuma ‘Think Home Philosopy, nke pụtara ka onye ọbụna mata na ọ nwere ebe o siri pụta.

Gọvanọ Willie Obiano nọ ugbua, na-akpọku ụmụ Anambra ka uche ha ruo ụlọ. Ọ bụrụ na anyị mee nke a, ọ ga-adịrị anyị na mma. Onye nwere ntị ya nụrụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here