Anambra a gbaala afọ iri abụọ na asaa

0
544
Anambra at 27

Uchenwa Mba na Chris Anyichie

ABALỊ iri abụọ na asaa nke ọnwa asatọ n’afọ ọbụla kemgbe 1991 bụ ụbọchị pụrụ iche nye ndị Anambra na ndị nile bi na ime ya. Ọ bụ ụbochị a mụrụ nwa ọhụrụ  bụ steeti Anambra.

Ọ na-abụrụ ndị nile nọ mgbe a mụpụtara ya ihe oke ọñụ oge nile ha chetara ya.

N’ezie, ọtụtụ ihe ka emegoro ka Anambra wee maa mma dịka nwagbọghọ a na-alụ ọhụrụ site na ezinaụlọ ruo otu ọ si gbasara ọchịchị gọọmenti steeti. Ọ dịkwa ọtụtụ ihe ọma nke Chineke jigworo ọtụtụ ndị chigworo Anambra mee.

Site na nkewapụta na nkwupụta onye na-achị n’oge ahụ bụ General Ibrahim Badamosi Babangida, Joseph Abulu bụ onye  ‘Nigeria Navy’  bụ onye mbụ akpolitere ịbụ onye ndu nwa ọhụrụ a bụ Anambra.

Onye nke abụọ ma bụrụ onye nkiti izizi chiri Anambra bụ Dọkịnta Pius Ezeife. Ọchịchị ya malitere ka ọnwa mbu n’afọ 1992 dị n’abali abụọ wee ruo ka ọnwa iri na otu dị n’abali iri na asaa n’afọ 1993. Onye  uwe ojii aha ya bụ Dabo Aliyu wee bata na ọchịchị dịka ndị agha  weghara ọchịchị n’aka ndị nkiti.

Ọchịchị CP Aliyu malitere n’ọnwa iri na otu wee kwụsi n’ọnwa iri na abụọ otu afọ ahụ. Na ọnwa nke iri na abụọ ahụ, onye sitere n’ụlọ ọlụ ndị agha aha ya bụ ‘Colonel’ Mike Attah batara dịka onye ndu. Ọ malitere n’ọnwa iri na abụọ n’afọ 1993 wee ruo ka ọnwa asatọ dị n’abali iri abụọ na otu nke afọ 1996.

Onye ọzọ bụ ‘Group Captain’ Rufia Garba malitere ka ọnwa nke asatọ dị n’abali iri abụọ na otu n’afọ 1996 wee ruo ka ọnwa asatọ dị n’abali isii afọ 1998. ‘Wing Commander’ Emmanuel Ukaegbu batara n’ọnwa asatọ n’afọ 1998 wee ruo n’abali iri na asaa n’ọnwa ise n’afọ 1999.

GUO:  COVID-19: ụlọọrụ Chisco enyela gọọmenti Anambra nde naịra iri

Ọchịchị onye kwuo uche ya malitere n’ala anyị n’afọ 1999 kpọbatara  Chinweoke Mbadinuju, bụ onye nke amara dịka Odera. Ọchịchị ya malitere n’afọ 1999 ruo 2003, mgbe ewepuru ya na ọchịchị.Dọkịnta Chris Nwabueze Ngige wee bata ma mee ọtụtụ ihe na-agbanyeghị ọtụtụ ihe na-eme n’oge ahụ ya na agha nile si n’aka ndị na-ekwenyeghị na ọchịchị ya nakwa gọọmenti ya.

Oke osisi a bụ Nwabueze Ngige malitere ọchịchị ya ka afọ 2003 dị n’abali iri abụọ na iteghete ruo ka ọnwa atọ dị na abali iri na isii afọ 2006. Ụlọikpe wepụrụ Chris Ngige, Maazị Peter Obi wee bata weghara ọchịchị malite ka ọnwa atọ n’afọ 2006 dị n’abali iri na asaa.

 

N’agbanyeghị na ụlọikpe nyere ya ọchịchị ahụ, ewepụrụ ya, mana nwepụ ahụ mere ka ihe dị iche wee mee. Nwepụ ahụ kpọbatara osote ya bụ ‘Dame’Virgy Etiaba, ọ weghara ọchịchị dịka nwanyị izizi bụ gọvanọ n’ala anyị bụ Nigeria.

Ọchikwara ọchịchị ya nke ọma. Ọmalitere ka ọnwa abụọ n’afọ 2007 dị na abali iteghete. Mgbe ụlọikpe mesiri nnyocha, ha nyeghachiri Maazị Peter Obi ọchịchị. Ọmalitere ọchịchị ọzọ ka ọnwa abụọ nke afọ 2007 dị n’abali iri abụọ na iteghete ruo n’ọnwa ise nke afọ 2007 dị na abali iri abụọ na asatọ. Andy Uba batakwara na ọchịchị malite ka ọnwa ise nke afọ 2007 dị na abali iri abụọ na iteghete ruo ka ọnwa isii nke afọ 2007 dị na abali isịị. E wepụrụ Andy Uba, nyeghachị Peter Obi ọchịchị ka ọnwa isịị nke afọ 2007 dị n’abali asaa.

Nkea ka ọ ọchịchaziri wee nyefezie ọchịchị n’aka Chief Willie Maduabuchukwu Obiano, bụkwa onye ka nọ n’ọchịchị ahụ wee ruo taa.

GUO:  Gọọmenti Anambra ehibela usoro agụmakwụkwọ pụrụ iche maka obodo niile iju mmiri na-akpa mkpa mkpa

Aka nile nke chigoro Anambra malite mgbe ekewapụtara ya ruo taa gbara mbọ dị iche iche ime ya ka ọbụrụ ihe ọ bụ taa. Ụfọdụ n’ime ha gbara mbọ ime Anambra ka oguzosie ike. Ụfọdụ gbakwara mbọ mana oke ọchịchọ dị n’oge ahụ ekweghị ka mbọ ha nile pụtachaa ihe ma ọ bụ ka ezi ebumnobi ha nwere mezuo.

Mmadụ dịka Chinwoke Mbadinuju batara site na mmeri onwetara na nhọpụta e mere. Na mbata ya, ọtụtụ ihe ka atụrụ anya n’aka ya ime – ịhazi Anambra nile na Awka bụ isi obodo Anambra, mana n’ihi ọtụtụ nsogbụ ọchịchị ya na-enwe n’oge ahụ, nani ihe ojisiri ike mee bụ ikpọbata ndị ‘Bakasi Boys’. Ndị ‘Bakasi Boys’ kpara ike dị egwu.

N’ihi enweghị ezi nchekwa n’oge ahụ, mmepe lara azụ nke ukwu, ndị ji ego gbara ọsọ eleghị anya n’azụ. Ọganiru adịghị otu atụrụ anya ya. Ndị ọlụ oyibo hujukwara anya n’oge ahụ. Ịgba abụbọ ọlụ mgbe nile, ajọ ụzọ, e nweghị ezi mmiri ọñụnụ, e nweghị ụlọ ọlụ ahụike dị mma, bụ ụfọdụ ihe pụtakarIsịrị ihe n’oge ahụ. Ihe ndịa nile nyekwara Mbadinuju na ọchịchị ya ajọ aha. Nkea mere na mgbe a họpụtara onye ga-achị ọzọ, na ụmụ afọ Anambra nyere ya na ọchịchị ya ajọ ọsọ.

Chineke kpọpụtara nkenke enyị na achụ igwe enyi ọsọ bụ Dọkịnta Chris Nwabueze Ngige. O kwesiri ka a kụọrọ ya aka maka na ọ gbara onwe ya ume. Ọ malitere dozibe okporo ụzọ nile dakpọrọ adakpo ma dịka ọ dị, ndị mmadụ malitere kwube na ọ bụ nani na mpaghara nke ya bụ Idemili ka ọ na-alụ.

N’oge ahụ ihe banyere nnaukwu (godfather) tinyere Ngige n’ọchịchị ya  na ndị Anambra aka ọjọọ nke mere na ọtụtụ ọlụ malitere laba azụ.

GUO:  Gọọmenti Anambra ebidola ịgba ọgwụ na-egbusi nje n'ahịa

E mesia, ndị ụlọikpe wepụrụ Nwabueze Ngige ma nye Maazị Peter Obi bụ onye nwetara mmeri n’oge emere nhọpụta ọchịchị.Maazị Peter Obi malitekwara dozibe ihe nile, tụba atụmatụ ka obodo ga-esi dịkwa mma ọzọ.  Ezi uche ya wetekwara ndị Anambra nile iru ọchị.

Ọ bụ ọlụ ọma ya mere na mgbe ọ kpọtara onye ọ dị ya ka ọ ga amalite ebe ọ kwụsịrị, ndị Anambra jikwa obi ụtọ họpụta ya dịka gọvanọ ndị Anambra. Onye ọchịchị ahụ bụ Chief Willie Maduabuchukwu Obiano batara dịka onye ndu ka ọnwa atọ, afọ 2014 dị na abali iri na asaa. Ọchịchị ya ruo taa na egosikwa na onye kpọpụtara ya hụrụ ezi ihe dị na ime ya.

Ọchịchị Willie Obiano bụ nọọ nke jụpụtara na ihe ọma dị iche iche, ọkachasị otu ọ gbasaara mmepe, ịzụ ahịa mba na mba, ezi mmekọrita n’etiti mmadụ na ibe ya, ịkwalite nka na ụzụ, ịkwado ọganiru na mmepe ime-ime obodo nile dị n’Anambra Steeti. Onyekwara ndị ọlụ oyibo nkwudosike site na ịkwụ ha ụgwọ ọlụ kwa ọnwa ọbụla n’oge na mgbe kwesiri. Nke kachasi nke bụ na ọ mere onye nabaa ụra, ọmechisie anya ya ike larụ ụra nke ọma. N’ezie aga akpọ ya ‘David ndi Anambra’

Ọ gara n’iru na-alụ akwa mmiri na Anambra West, okporo ụzọ dị na Uke, Umunankwo, Ogwuaniocha, Ogbaru, Amawbia-Agu Awka na ọtụtụ ndị ọzọ.

N’ezie, ọlụ ọma nke nwa amadi a n’alụ gosiri na ọchịchị APGA dịịrị ndị Anambra mma.

 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here